YouVersion Logo
Search Icon

ILU 28

28
1Ndi nēmebi iwu ab͕alagawo mb͕e ọ dighi onye nāchu ha:
Ma ndi ezi omume nwere ntukwasi-obi dika ọdum.
2N'ihi njehie nke ala ha di ọtutu, bú ndi-isi-ya:
Ma site na madu nwere nghọta na ihe-ọmuma ka ọnọdu-ya gādigide ogologo mb͕e.
3Nwoke bu ob͕eye nke nēmeb͕u ndi nēnweghi ike,
Ọ di ka miri-ozuzo nke nāzachapu ihe, nri we ghara idi.
4Ndi nārapu iwu nēto onye nēmebi iwu,
Ma ndi nēdebe iwu nāluso ha ọ̀gù.
5Ndi ọjọ adighi-aghọta ikpé:
Ma ndi nāchọ Jehova nāghọta ihe nile.
6Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya,
Kari onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ-ya abua, ọ bu ezie na onye ahu bu ọgaranya.
7Onye nēdebe iwu bu nwa nāghọta ihe:
Ma onye bu eyì ndi nēribiga ihe ókè nētiye nna-ya n'onọdu-ihere.
8Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa,
Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.
9Onye nēwezuga nti-ya n'inu iwu,
Ọbuná ekpere-ya bu ihe-árú.
10Onye nēme ka ndi ziri ezi waghari n'uzọ ọjọ,
N'olùlù nke aka ya ka ya onwe-ya gādabà:
Ma ndi zuru okè gēketa ezi ihe.
11Onye mara ihe n'anya-ya ka ọgaranya bu;
Ma onye nēnweghi ike nke nāghọta ihe nēgwuputa ala-ya.
12Mb͕e obi ndi ezi omume nātọ ha utọ, ọtutu ima-nma di:
Ma mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, agāchọ madu achọ.
13Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya:
Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.
14Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātu oké egwu mb͕e nile:
Ma onye nēme ka obi-ya sie ike gādabà n'ihe ọjọ.
15Ọdum nke nāb͕o uja na anu-ọhia bear nke nāb͕aghari
Ka onye nēmebi iwu nke nāchi ndi nēnweghi ike bu.
16Gi onye-ndú nke nghọta kọrọ, nke bu kwa onye-nmeb͕u uku,
Onye nākpọ urù nēzighi ezi asì gēme ka ubọchi-ya nile di ogologo.
17Madu nke ọbara madu nānyib͕u,
Rue olùlù ka ọ gāb͕alaga; ka onye ọ bula ghara ijide ya.
18Onye nēje ije n'izu-okè ka agāzọputa:
Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ abua gāda ngwa ngwa.
19Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri:
Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, afọ gēju ya n'ibu-ob͕eye.
20Onye ọ bula nke kwesiri ntukwasi-obi gēnwe ọtutu ngọzi:
Ma onye nānukpọ onwe-ya ibu ọgaranya, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
21Imata iru madu n'ikpé adighi nma:
Ọ dighi kwa nma ka madu ji n'ihi iberibe nri nējehie.
22Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu,
Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya.
23Onye nābara madu nba gēmesia huta amara
Kari onye nēkwu ire-utọ.
24Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n'ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu;
Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu.
25Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu:
Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba.
26Onye nātukwasi obi n'obi nke aka ya, onye ahu bu onye-nzuzu:
Ma onye nēje ije n'amam-ihe, onye ahu ka agēme ka o wepuga onwe-ya.
27Onye nēnye ob͕eye ihe, ihe adighi-akọ ya:
Ma onye nēzobe anya-ya abua, agābu ya ọtutu ọnu.
28Mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, madu ezobe onwe-ya:
Ma mb͕e ha nāla n'iyì, ndi ezi omume aba uba.

Currently Selected:

ILU 28: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in