YouVersion Logo
Search Icon

ILU 30

30
1Okwu Agua nwa Jake; ibu eboro ya.
Ihe nke si n'ọnu nwoke ahu putara Itiel, ọbuná Itiel na Ukal.
2N'ezie anu-ọhia ka m'bu kari onye ọ bula,
Ọ dighi kwa nghọta madu m'nwere
3Amutaghkwam amam-ihe,
Ọ dighi kwa ihe-ọmuma Onye Nsọ m'mara.
4Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida?
Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua?
Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya?
Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike?
Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?
5Okwu-ọnu ọ bula nke Chineke bu ihe anuchaworo:
Ọta ka Ọ buru ndi nāb͕abà nime Ya.
6Atukwasila ihe n'okwu-Ya nile,
Ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha.
7Ihe abua ka m'riọworo Gi;
Ajulam ha tutu mu anwua:
8Me ka ihe-efu na okwu-ugha di anya n'ebe m'nọ:
Enyelam ọnọdu-ob͕eye ma-ọbu àkù;
Me ka m'rie nri rurum:
9Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova?
Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori,
We were aha Chinekem me ihe ọjọ.
10Ekpèla orù ikpè n'iru onye-nwe-ya,
Ka o we ghara ikọcha gi, ikpé ewe ma gi.
11Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha,
Ha adighi-agọzi kwa nne-ha.
12Ọb͕ọ di nke di ọcha n'anya-ha,
Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi.
13Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku!
Anēbuli kwa mbubere-anya-ha.
14Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu,
Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu.
15Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye.
Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju,
E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo:
16Ala-mọ; na afọ nwayi-àgà;
Na ala afọ miri nējughi;
Na ọku nke nāsighi, O b͕owo.
17Anya nke nākwa nna-ya emò,
Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti,
Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya,
Umu-ugo gēri kwa ya.
18Ihe atọ di nke karirim ighọta,
E, anọ nke m'nāmagh:
19Uzọ ugo n'elu-igwe;
Uzọ agwọ n'elu oké nkume;
Uzọ ub͕ọ n'etiti oké osimiri;
Na uzọ nwoke n'ebe nwa-ab͕ọghọ nọ.
20Otú a ka uzọ nwayi nākwa iko di;
O riwo ihe, hicha kwa ọnu-ya,
Si, Emeghm ajọ ihe ọ bula.
21N'okpuru ihe atọ ka uwa maworo jijiji,
N'okpuru ihe anọ kwa, nke ọ nāpughi iburu:
22N'okpuru orù mb͕e ọ nāghọ eze;
Na onye-nzuzu mb͕e nri nēju ya afọ;
23N'okpuru nwayi anākpọ asì mb͕e ọ nwere di;
Na nwanyi nēje ozi mb͕e ọ nēketa ihe nwanyi-nwe-ya.
24Ihe anọ di nke di ntà n'elu-uwa,
Ma ihe ahu mara ihe nke-uku:
25Danda bu ndi nādighi ike,
Ma ha nēdozi nri-ha na mb͕e okpom-ọku;
26Coney bu ndi nēnweghi ume,
Ma ha nēdo ulo-ha na nkume di elu;
27Ọ dighi eze igurube nwere,
Ma mb͕e ha nāpu ha nēkè onwe-ha n'usu, ha nile;
28Nche-ulo nēji aka-ya nile agigado,
Ma ihe ahu di n'ulo uku eze.
29Ihe atọ di nke nāzọ ukwu nke-ọma,
E, anọ di nke nēje ije nke-ọma:
30Ọdum, nke bu dike n'etiti anu nile,
Ọ dighi-esi kwa n'iru ihe ọ bula laghachi azu;
31Inyinya-agha; na nkpi;
Na eze, nke nbili megide ya nādighi.
32Ọ buru na i zuzuwo nzuzu n'ibuli onwe-gi,
Ma-ọbu ọ buru na i zubewo nzube ọjọ,
Tukwasi aka-gi n'ọnu-gi.
33N'ihi na opìpì miri-ara-ehi nēweputa miri-ara raru araru,
Ọzọ, opìpì imi nēweputa ọbara:
Otú a ọpìpì iwe nēweputa ise-okwu.

Currently Selected:

ILU 30: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in