YouVersion Logo
Search Icon

JOB 11

11
1Zofa, bú onye Neama, we za, si,
2Àgaghi-aza ọtutu okwu?
Àgāgu kwa onye eb͕ub͕ere-ọnu n'onye ezi omume?
3Ekwukwu-Gi nile nēme ka madu b͕a nkiti;
I we chìa ọchì, ma ọ dighi onye nēme ka ihere me gi.
4I we si, Nmutam di ọcha,
M'di kwa ọcha n'anya-Gi.
5Ma otú ọ di, ọ gādim nọ̄ nma ma asi na Chineke ekwue okwu,
Saghe eb͕ub͕ere-ọnu-Ya megide gi;
6Gosi gi ihe-nzuzo nile nke amam-ihe,
Na ọ di okpukpu n'izube ihe.
Gi mara kwa na Chineke nēme ka echezọrọ gi ufọdu nime ajọ omume-gi.
7Ì gēsi n'ogwugwu chọputa Chineke?
Ì gāchọputa Onye Nke puru ime ihe nile rue ebe Ọ sọturu?
8Ọ ra ka ebe di elu nile nke elu-igwe; gini ka i gēme?
Ọ di omimi kari ala-mọ; gini ka i gāmara?
9Ọtùtù-ya di ogologo kari uwa,
Di kwa obosara kari oké osimiri.
10Ọ buru na Ọ ga n'iru, mechibido madu uzọ,
Kpọkọta nkpọkọta, ònye gēme kwa ka Ọ laghachi?
11N'ihi na Ya onwe-ya mara madu efu:
Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya.
12Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi,
Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu.
13Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi,
We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ;
14Ọ buru na ajọ ihe adi n'aka-gi, me ka ọ di n'ebe di anya,
Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile;
15N'ihi na mb͕e ahu i gēweli iru-gi nēnweghi ọlu n'aru-gi;
I gābu kwa ihe siri ike dika ọla awuru awu, i gaghi-atu kwa egwu:
16N'ihi na gi onwe-gi gēchezọ ọnọdu ọjọ gi,
Dika miri nke gabigara agabiga ka i gēcheta ya:
17Kari etiti-ehihie ka ubọchi ndu-gi gēbili kwa;
Ọ buru na oké ọchichiri adi, ọ gādi ka ututu.
18I gātukwasi kwa obi, n'ihi na olile-anya di;
I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina.
19Ọzọ kwa, i gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka i ma jijiji;
Ọtutu madu gēme kwa ka iru-gi dajua.
20Ma anya ndi nēmebi iwu gādala n'isi,
Ebe-nb͕alaga alanariowo kwa ha n'iyì,
Nkubì-ume bu kwa olile-anya-ha.

Currently Selected:

JOB 11: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in