YouVersion Logo
Search Icon

JOB 10

10
1Ike ndum agwuwo nkpuru-obim;
Ka m'rapuru onwem ntamum;
Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.
2M'gāsi Chineke, Amalam ikpe;
Me ka m'mara ihe kpatara I ji som se okwu.
3Ọ̀ di Gi nma ka I meb͕ue nmeb͕u,
Ka I ju ndọb͕u-n'ọlu nke ọbu-aka-Gi abua,
We mukwasi ìhè na ndum-ọdu ndi nēmebi iwu?
4Ọ̀ bu anya anu-aru ka I nwere,
Ma-ọbu na I nāhu dika madu si ahu?
5Ọ̀ bu dika ubọchi madu si di ka ubọchi-Gi di?
Ma-ọbu arọ-Gi, hà di ka ubọchi madu,
6Na I nāchọ ajọ omumem,
Nāju kwa ase nmehiem?
7Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu;
Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n'aka-Gi.
8Aka-Gi dozirim, we kpuam
Ka m'buru otù buruburu; ma I nēlodam.
9Biko, cheta na dika urọ ka I kpuworom;
Ì gēme kwa ka m'laghachi n'ájá?
10Ọ̀ bughi dika miri-ara ka I nāwusim,
Me ka m'raru araru dika cheese?
11Akpukpọ-aru na anu-aru ka I yikwasirim,
Were kwa ọkpukpu na akwara kpam dika ákwà.
12Ndu na ebere ka I meworo ka m'nwe,
Nlekọta-gi edebewo kwa mọm.
13Ma I zoro ihe ndia n'obi-Gi;
Amawom na nka di n'aka-Gi:
14Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya,
I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem.
15Ọ buru na emebiwom iwu, ahuhu dirim;
Ọ buru kwa na abum onye ezi omume, m'gaghi-eweli isim elu;
Ebe nlelìm juworom afọ,
Ya na ilekwasi nwedam anya.
16Ọ buru kwa na isim ewelie onwe-ya n'elu, dika ọdum nke nāb͕ọ uja ka I nāchu ntám:
I we laghachi gosi Onwe-gi onye di ebube megidem.
17I nēme ka ndi-àmà-Gi di ọhu n'irum,
Nēme kwa ka nkpasu-iwe-Gi ba uba n'ebe m'nọ;
Nb͕anwe na usu-ndi-agha di n'ebe m'nọ.
18N'ìhi gini kwa ka I ji me ka m'si n'àkpà-nwa puta?
M'gēkubìwori ume, ọ dighi kwa anya gāhum.
19Dika agāsi na ọ dighi mb͕e m'nọ, otú a ka m'gādi;
Site n'afọ nnem rue ílì ka agēbum.
20Ùbọchim adighi ole-na-ole? rapu kwa,
Dopu Onwe-gi n'ebe m'nọ, ka m'we b͕asa irum nwantī,
21Tutu alam, ghara kwa ilaghachi,
Rue ala ọchichiri, na onyinyo ọnwu;
22Ala oké ọchichiri, dika oké ọchichiri onwe-ya;
Ala onyinyo ọnwu, nke usoro nādighi ya,
Ebe ọmumu-ìhè di kwa ka oké ọchichiri.

Currently Selected:

JOB 10: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in