YouVersion Logo
Search Icon

JOB 12

12
1Job we za, si,
2N'ezie unu onwe-unu bu ndi bu ihe,
Unu na amam-ihe gānwukọ n'otù.
3Enwe-kwa-ram obi dika unu;
Mu onwem abughi onye dara ada kari unu:
Ma ònye ka ọ bu nke ihe dika ndia nādighi n'aka?
4Onye bu ihe-ọchì nke madu-ibe-ya ka m'bu,
Bú onye nākpọku Chineke, O we za ya:
Ihe-ọchì ka onye ezi omume nke zuru okè bu.
5Nleda diri ọdida n'èchìchè onye nọ jū;
Edoziwo ya nye ndi ukwu-ha nāb͕uchapu ab͕uchapu.
6Ulo-ikwū nile nke ndi nāpunara madu ihe di n'udo,
Ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi nākpasu Chineke iwe;
Bú onye ọ bula nke wetaworo chi-ya n'aka-ya.
7Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe,
Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi:
8Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe;
Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi.
9Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile,
Na aka Jehova emewo nka?
10Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya,
Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.
11Nti, ọ̀ dighi-anwa okwu?
Okpo-ọnu kwa, ọ̀ dighi-edeturu onwe-ya ihe-oriri-ya?
12Nime ndi kara nká ka amam-ihe di,
N'ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.
13N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di;
Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.
14Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ;
Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.
15Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ;
Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.
16N'aka-Ya ka ike na nzube-ihe di;
O nwere onye nēmehie n'amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n'amaghi-ama.
17Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n'agha,
Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.
18Ab͕u ndi-eze kere ka Ọ tọpuworo,
We ke ihe-ọkiké n'úkwù-ha.
19Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha,
Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.
20Ọ nēwezuga okwu eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi,
Ezi uche nke ndi-okenye ka Ọ nēwepu kwa.
21Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha,
Akpukpọ-úkwù nke ndi di ike ka Ọ kpọpu-kwa-ra.
22Ọ nēsi n'ọchichiri kpughepu ihe di omimi,
We me ka onyinyo ọnwu puta ìhè.
23Ọ nēme ka mba di uku, Ọ nēme kwa ka ha la n'iyì:
Ọ nāb͕asa mba, nēdu kwa ha.
24Ọ nēwezuga obi ndi-isi nke ndi uwa,
We me ka ha waghari n'ebe tọb͕ọrọ n'efu ebe uzọ nādighi.
25Ha nāsọghari ìsì n'ọchichiri nēnweghi ìhè,
O we me ka ha kpafue dika onye ṅubigaworo manya ókè.

Currently Selected:

JOB 12: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in