YouVersion Logo
Search Icon

II. SAMUEL 2

2
1O rue, ka nka gasiri, na Devid juru Jehova ese, si, M'gārigo n'otù nime obodo Juda? Jehova we si ya, Rigo. Devid we si, Òle ebe M'gārigo? Ọ si, Rue Hebron. 2Devid we rigo n'ebe ahu, ya na ndinyom-ya abua kwa, bú Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail, bú nwunye Nebal onye Kamel. 3Ndikom ndi ya na ha nọ ka Devid me-kwa-ra ka ha rigota, nwoke ọ bula na ulo-ya: ha we biri n'obodo nile nke Hebron. 4Ndikom Juda we bia te Devid manu n'ebe ahu ibu eze ulo Juda.
Ha we gosi Devid, si, Ndikom Jebesh-gilead bu ndi lìri Sọl. 5Devid we zigara ndikom Jebesh-gilead ndi-ozi, si, ha, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, na unu emeworo onye-nwe-unu, bú Sọl, ebere a, unu we líe-ya. 6Ma ub͕u a Jehova mere unu ebere na ezi-okwu: ọzọ kwa, mu onwem gēmeghachiri unu ezi ihe a, n'ihi na unu emewo ihe a. 7Ma ub͕u a ka aka-unu di ike, buru-kwa-nu ndi-dinkpà: n'ihi na onye-nwe-unu, bú Sọl, anwuwo; ọzọ kwa, mu ka ulo Juda teworo manu ibu eze-ha.
8Ma Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha Sọl nwere, kuru Ish-boshet nwa Sọl, me ka ọ gabiga rue Mahanaim; 9o we me ya eze Gilead, na nke ndi-Ashurait, na nke Jezreel, na nke Efraim, na nke Benjamin, na nke Israel nile. 10(Ish-boshet nwa Sọl b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ malitere ibu eze Israel, o we buru eze arọ abua.) Otù ọ di, ulo Juda soro Devid. 11Ọnu-ọgugu ubọchi Devid bu eze ulo Juda nime Hebron we di arọ asa na ọnwa isi.
12Abnea nwa Nea, na ndi-orù Ish-boshet nwa Sọl, we si na Mahanaim puta rue Gibeon. 13Joab nwa Zeruaia, na ndi-orù Devid, we pua, zute ha n'otù n'akuku ọdọ-miri Gibeon; ha we nọdu, ndi Devid n'otu akuku ọdọ-miri, na ndi Ish-boshet n'akuku nke-ọzọ nke ọdọ-miri. 14Abnea we si Joab, Biko, ka umu-okorọbia bilie, me ihe-ọchì n'iru ayi. Joab we si, Ka ha bilie. 15Ha we bilie gabiga n'ọnu-ọgugu; madu iri na abua diri Benjamin, di-kwa-ra Ish-boshet nwa Sọl, na madu iri na abua nime ndi-orù Devid. 16Ha we jide, nwoke ọ bula o jide isi ibe-ya, we ma mma-agha-ya n'akuku ibe-ya; ha we dakọ n'otù: ewe kpọ aha ebe ahu Helkat-hazurim, nke di na Gibeon. 17Agha we di ike nke-uku n'ubọchi ahu, ewe tib͕ue Abnea na ndikom Israel n'iru ndi-orù Devid. 18Umu-ndikom Zeruaia atọ nọ kwa n'ebe ahu, bú Joab, na Abishai, na Asahel: ma ukwu Asahel di nfe n'ib͕a ọsọ dika otù nime mb͕ada nke di n'ọhia. 19Asahel we chua Abnea n'azu; ma o sighi n'iso Abnea wezuga onwe-ya ije n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe. 20Abnea we gha anya n'azu, si, Ọ̀ bu gi bu nka, Asahel? Ọ si, Mu ka ọ bu. 21Abnea we si ya, Wezuga onwe-gi n'aka-nri-gi ma-ọbu n'aka-ekpe-gi, jidere onwe-gi otù nime umu-okorọbia, chiri n'onwe-gi ihe-ya i gāluta. Ma Asahel ekweghi isi n'iso ya wezuga onwe-ya. 22Abnea we si kwa Asahel ọzọ, Si n'isom wezuga onwe-gi: nìhi gini ka m'gētib͕u gi rue ala? m'gēsi kwa aṅa weliere Joab nwa-nne-gi irum? 23Ma ọ juru iwezuga onwe-ya: Abnea we were isi ube-ya tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise, ube we puta n'azu ya, o we da n'ebe ahu, nwua n'okpuru ya: o rue, na ndi nile ndi biaruru ebe ahu, bú ebe Asahel dara nwua, guzoro. 24Ma Joab na Abishai churu Abnea n'azu; anyanwu we da mb͕e ndi ahu biaruru ugwu ntà Ama, nke di n'iru Gia n'uzọ ọzara Gibeon. 25Umu Benjamin we chikọta onwe-ha iso Abnea n'azu, ha we ghọ otù usu, guzo, n'elu otù ugwu ntà. 26Abnea we kpọ Joab òkù, si, Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka mma-agha gēripia? ì maghi na ilu ka ọ gādi n'ikpe-azu? rù kwa ole mb͕e ka i nāgaghi-asi ndi-gi ka ha si n'iso umu-nne-ha laghachi? 27Joab we si, Chineke nādi ndu, ọ buru na i kwughi, n'ezie mb͕e ahu site n'ututu ndim gārigowori, nwoke ọ bula site n'iso nwa-nne-ya. 28Joab we fùa opì-ike, ndi-ya nile we guzo, ha achughi kwa Israel n'azu ọzọ, ha ebughi kwa agha ọzọ. 29Ma Abnea na ndikom-ya jere ije n'Araba abali ahu nile; ha we gabiga Jọdan, je ije na Bitron nile, bia rue Mahanaim. 30Joab we si n'iso Abnea lata: ọ we chikọta ndi-ya nile, ma agukọtara ndikom iri na iteghete na Asahel ndi nādighi n'etiti ndi-orù Devid. 31Ma ndi-orú Devid tib͕uru ọgu ndikom iri-na-asatọ sitere na Benjamin, na n'etiti ndikom Abnea, ha we nwua. 32Ha we bulie Asahel, lìe ya n'ílì nna-ya, nke di na Bet-lehem. Joab na ndikom-ya we je ije abali ahu nile, ìhè ututu we putara ha na Hebron.

Currently Selected:

II. SAMUEL 2: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in