YouVersion Logo
Search Icon

II. SAMUEL 1

1
1O rue, mb͕e ọnwu Sọl gasiri, mb͕e Devid siri na ntib͕u Amalek lata, mb͕e Devid nọwo-kwa-ra na Ziklag ubọchi abua; 2o rue, nubọchi nke-atọ, na, le, otù nwoke siri n'ọmuma-ulo-ikwū puta, site n'ebe Sọl nọ, uwe-ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi n'isi-ya: o rue, mb͕e ọ biakutere Devid, na ọ daruru ala, we kpọ isi ala. 3Devid we si ya, Òle ebe i si bia? Ọ si ya, N'ọmuma-ulo-ikwū Israel ka m'wepugara onwem. 4Devid we si ya, Gini bu ihe emere? biko, gosim. Ọ si, Na ndi Israel esiwo n'agha b͕alaga, ọzọ kwa, ọtutu nime ndi Israel adawo nwua; ọzọ kwa, Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu. 5Devid we si nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya, Ì si aṅa mara na Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu? 6Nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya we si, Ọ dabataram inọ n'ugwu Gilboa, ma, le, Sọl nādabere n'ube-ya; ma, le, ub͕o-ala na ndi-nwe inyinya sosiri ya ike. 7o we gha anya n'azu, hum, we kpọm òkù. M'we si, Lem. 8Ọ sim, Ònye ka i bu? M'we si ya, Onye Amalek ka m'bu. 9Ọ sim, Biko, guzo n'akukum, me ka m'nwua, n'ihi na anya-ajù ejidewom: n'ihi na ndum nile dizu nimem. 10M'we guzo n'akuku ya, me ka ọ nwua, n'ihi na amaram na ọ gaghi-adi ndu mb͕e ọ dasiri: m'were okpu-eze nke di n'isi-ya, na ọla-aka nke di n'ogwe-aka-ya, we chitara ha onye-nwem n'ebe a. 11Devid we jide uwe-ya, dọwa ha; otú a ka ndikom nile ya na ha nọ me-kwa-ra. 12Ha we tie aka n'obi, kwa ákwá, bue ọnu rue anyasi, n'ihi Sọl, na n'ihi Jonatan nwa-ya, na n'ihi ndi Jehova, na n'ihi ulo Israel; n'ihi na ha dara site na mma-agha. 13Devid we si nwa-okorọbia nēgosi ya, Òle ebe i si bia? Ọ si Nwa ọbìa, bú onye Amalek, ka m'bu. 14Devid we si ya, Ì si aṅa ghara itu egwu iseti aka-gi ibibi onye Jehova etere manu? 15Devid we kpọ otù nime umu-okorọbia, si, Jerue nso, dakwasi ya. O we tib͕ue ya, o we nwua. 16Devid we si ya, Ọbara-gi dikwasi n'isi-gi; n'ihi na ọnu-gi azawo megide gi, si, Mu onwem emewo ka ọ nwua, bú onye Jehova etere manu.
17Devid we were abù-ákwá nka bùara Sọl, bù-kwa-ra Jonatan nwa-ya: 18Ọ we si ha zi umu Juda abù uta: le, edewo ya n'akwukwọ Jasha.
19Israel, eb͕uwo nmá-gi n'elu ebe di elu gi!
Ndi-dike esiwo aṅa da!
20Unu egosila ya nime Gat,
Unu ezisala ozi-ya n'èzí nile nke Ashkelon;
Ka umu-ndinyom ndi Filistia we ghara iṅuri ọṅu,
Ka umu-ndinyom nke ndi anēbìghi úgwù we ghara iṅuri ọṅu-agha.
21Unu ugwu Gilboa,
Ka igirigi ma-ọbu miri-ozuzu ghara idikwasi unu, ma-ọbu ubi nke àjà-nbuli:
N'ihi na ebe ahu ka asọrọ ọta ndi-dike oyi,
Ọta Sọl dika agāsi na ọ bu onye anēteghi manu.
22Ọbara ndi eb͕uru eb͕u, abuba ndi-dike,
Uta Jonatan esighi na ha la azu,
Mma-agha Sọl esighi kwa lata n'efu.
23Sọl na Jonatan bu ndi nāhurita onwe-ha n'anya, buru kwa ndi di utọ na ndu-ha,
Ekewaghi kwa ha n'ọnwu-ha;
Ha di garagara kari ugo,
Ha di ike kari ọdum.
24Umu-ndinyom Israel, kwaranu Sọl ákwá,
Onye nēyibe unu uwe uhie, ya na ihe-utọ di iche iche,
Onye nātukwasi ihe-ichọ-nma ọla-edo n'uwe-unu.
25Ndi-dike esiwo aṅa da n'etiti agha ahu!
Jonatan, n'elu ebe-gi di elu ka i buru onye eb͕uru eb͕u.
26Anọm na nkpà n'ihi gi, nwa-nnem Jonatan:
I di utọ nke-uku n'ebe m'nọ:
Ihu-n'anya-gi nke i hurum di ebube,
Kari ihu-n'anya ndinyom.
27Ndi-dike esiwo aṅa da!
Ihe-agha esiwo aṅa la n'iyì!

Currently Selected:

II. SAMUEL 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in