YouVersion Logo
Search Icon

II. SAMUEL 3

3
1Agha ahu we di ogologo n'etiti ulo Sọl na ulo Devid: ma Devid di ike nāga n'iru, ma ulo Sọl enweghi ike nāla azu azu.
2Ewe muara Devid umu-ndikom nime Hebron: ọkpara-ya bu Amnon, nke Ahinoam, bú nwayi Jezreel, muru; 3nwa-ya nwoke nke-abua bu Kileab, nke Abigail nwunye Nebal, bú onye Kamel, muru; nke-atọ bu Absolom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua; 4nke-anọ bu Adonaija nwa Hagit; nke-ise bu Shefataia nwa Abital; 5nke-isi bu Itream, nke Egla nwunye Devid muru. Ndia ka amuru Devid nime Hebron.
6O rue, mb͕e agha di n'etiti ulo Sọl na ulo Devid, na Abnea nēme onwe-ya ka ọ di ike n'ulo Sol. 7Ma Sọl nwere iko-nwayi, aha-ya bu Rizpa, nwa-nwayi Aia. Ish-boshet we si Abnea, Gini mere i bakuru iko-nwayi nnam? 8Iwe Abnea we di ọku nke-uku n'ihi okwu Ish-boshet, ọ si, Ọ̀ bu isi nkita nke ulo Juda nwere ka m'bu? Ta ka m'nēmere ulo Sọl, bú nna-gi, nēme-kwa-ra umu-nne-ya, nēme-kwa-ra ndi-eyì-ya, ebere, emeghkwam ka i rue Devid aka, ma i nēbom ebubo ajọ omume bayere nwayi a ta. 9Chineke me Abnea otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, ma asi na emereghm Devid ọbuná otú a, bú dika Jehova ṅuworo ya iyi; 10ime ka ala-eze si n'ulo Sọl gabiga, na ime ka oche-eze Devid guzosie ike n'elu Israel na n'elu Juda, site na Dan we rue na Bia-sheba. 11Ma ọ pughi izaghachi Abnea okwu ọzọ, n'ihi na ọ turu egwu ya.
12Abnea we zigara Devid ndi-ozi n'ọnọdu ya, si, Ònye nwe ala? ọ si-kwa-ra, Ka mu na gi b͕a ndu, ma, le, akam gādiri gi, ime ka Israel nile chigharia biakute gi. 13Ọ we si, Ọ di nma; mu onwem na gi gāb͕a ndu: nání, otù ihe ka mu onwem nāju n'aka-gi, si, I gaghi-ahu irum, ma ọ buru na i bughi uzọ me ka Maikal nwa Sọl bia, mb͕e i gābia ihu irum. 14Devid we zigara Ish-boshet nwa Sọl ndi-ọzi, si, Nyem nwunyem, bú Maikal, onye m'ji ọgu api ise nke ndi Filistia lutara onwem. 15Ish-boshet we ziga, nara ya n'aka di-ya, bú n'aka Paltiel nwa Laish. 16Di-ya we soro ya je, nēje nākwa ákwá n'azu ya rue Bahurim. Abnea we si ya, Je, laghachi: o we laghachi.
17Okwu Abnea we diyere ndi-okenye Israel, si, Na mb͕e gara aga unu nāchọ Devid ka ọ buru eze-unu: 18Ma ub͕u a menu ya: n'ihi na Jehova ekwuwo okwu bayere Devid, si, M'gēwere aka Devid, bú orùm, zọputa ndim, bú Israel, n'aka ndi Filistia, na n'aka ndi-iro-ha nile. 19Abnea kwu-kwa-ra na nti Benjamin: Abnea we je kwa ikwu na nti Devid nime Hebron ihe nile nke di nma n'anya Israel, na n'anya ulo Benjamin nile. 20Abnea we biakute Devid rue Hebron, ya na orú ndikom. Devid we mere Abnea, me-kwa-ra ndikom soro ya, oké oriri. 21Abnea we si Devid, Ka m'bilie je chikọtara onye-nwem, bú eze, Israel nile, ka gi na ha we b͕a ndu, ka i we buru kwa eze ndi nile nke nkpuru-obi-gi nāchọsi ike. Devid we zilaga Abnea, o we la n'udo. 22Ma, le, ndi-orù Devid na Joab si n'usu ndi nāpunara madu ihe bia, ọ bu kwa ọtutu ihe-nkwata ka ha bubatara n'aka ha: ma Abnea anọyeghi Devid nime Hebron; n'ihi na o zilagawo ya, o we la n'udo. 23Joab na usu-ndi-agha nile ndi soro ya we bia, ha we gosi Joab, si, Abnea nwa Nea biakutere eze, o we zilaga ya, o we la n'udo. 24Joab we biakute eze, si, Gini ka i meworo? le, Abnea biakutere gi; n'ìhi gini ka nka bu, na i zilagawo ya, o we lasia? 25I mawo Abnea nwa Nea, na ọ bu irafu gi ka ọ biara, ya na imara ọpupu-gi na nbata-gi, na imata ihe nile nke gi onwe-gi nēme. 26Joab we si n'ebe Devid nọ puta, ziga ndi-ozi n'azu Abnea, ha we me ka o si n'olùlù-miri Saira biaghachi: ma Devid amaghi. 27Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya. 28Devid we nu nke a mgbe emesiri, ọ si, Ndi puworo n'ọbara Abnea nwa Nea n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi ka mu na ala-ezem bu: 29ka ọ dakwasi n'isi Joab, na n'ulo nna-ya nile; ka aghara kwa ibipu n'ulo Joab onye nwere orùrù n'anu-aru-ya, ma-ọbu onye-ekpenta, ma-ọbu onye nādabere na nkpa-n'aka, ma-ọbu onye nāda site na mma-agha, ma-ọbu onye nri kọrọ. 30Ma Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, b͕uru Abnea, n'ihi na o mere ka nwa-nne-ha, bú Asahel, nwua nime Gibeon n'agha ahu.
31Devid we si Joab, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Dọwanu uwe-unu, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tie aka n'obi n'iru Abnea. Eze, bú Devid, nējeso kwa ihe eji ebu ozu. 32Ha we lìe Abnea nime Hebron: eze we welie olu-ya kwa ákwà n'ílì Abnea; ndi Israel nile we kwa ákwà. 33Eze we bùara Abnea abù-ákwà, si,
Ọ̀ bu dika onye-nzuzu nānwu ka Abnea gānwu?
34Ekeghi aka-gi abua ab͕u, emeghi kwa ka ukwu-gi abua biarue nso ihe ọla eji ke ukwu ab͕u:
Dika onye nāda n'iru ndi ajọ omume, otú a ka i dara.
Ndi Israel nile we kwara ya ákwá ọzọ. 35Ndi ahu nile we bia ime ka Devid rie nri mb͕e ubọchi fọduru; ma Devid ṅuru iyi, si, Chineke mem otú a, me kwa ihe ọzọ otú a, ọ buru na edetum nri ọnu, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ, tutu ọdida-anyanwu. 36Ndi-ya nile we mata, ọ di nma n'anya-ha: dika ihe ọ bula eze mere di nma n'anya ndi-ya nile. 37Ndi-ya nile na Israel nile we mara n'ubọchi ahu na o siteghi n'aka eze ime ka Abnea nwa Nea nwua. 38Eze we si ndi-orù-ya, Únu amaghi na onye-isi na onye uku adawo n'Israel ta? 39Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.

Currently Selected:

II. SAMUEL 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in