JENESIS 4

4
1Madu ahu we mara aru Iv, bú nwunye-ya; o we turu ime, mua Ken, si, Enwetawom nwoke site n'iye-aka Jehova. 2Ọzọ kwa, ọ mua nwa-nṅe-ya nwoke, bú Ebel. Ebel we buru onye nāzù ìgwè ewu na aturu, ma Ken bu onye nālu ọlu ubi. 3O rue, n'ọgwugwu ubọchi ufọdu, na Ken wetara ufọdu nime nkpuru ala ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova. 4Ebel kwa, ya onwe-ya wetakwara ufọdu nime umu eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu ya, na ufọdu nime iberibe-ha mara abuba. Jehova we le Ebel, le kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, anya ọma: 5ma Ken na onyinye-inata-iru-ọma-ya, O leghi ha anya ọma. Ken we we iwe di ọku nke-uku, iru-ya we b͕arua. 6Jehova we si Ken, N'ìhi gini ka i nēwe iwe di ọku? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka iru-gi b͕aruru? 7Ọ buru na i nēme nke-ọma, ọ̀ bughi nb͕asa-iru ka i gēnwe? ọ buru kwa na i meghi nke-ọma, n'ọnu-uzọ ka nmehie nāma-kpu dika anu-ọhia: ọ bu kwa n'ebe i nọ ka ọchichọ-ya di, ma ọ kwesiri ka gi onwe-gi chia ya. 8Ken we si Ebel, bú nwa-nne-ya, Ka ayi je n'ọhia. O rue, mb͕e ha nọ n'ọhia, na Ken biliri imegide Ebel, bú nwa-nne-ya, we b͕ue ya. 9Jehova we si Ken, Òle ebe Ebel, bú nwa-nne-gi, nọ? Ọ we si, Amaghm: ọ̀ bu onye-nche nwa-nnem ka m'bu? 10Ọ si, Gini ka i meworo? ge nti! olu ọbara nwa-nne-gi nētikum site n'ala. 11Ma ub͕u a, onye anābu ọnu ka i bu site n'ala, nke saghere ọnu-ya inara ọbara nwa-nne-gi n'aka-gi; 12mb͕e i nālu ọlu ubi, ọ gaghi-enye gi ike-ya ọzọ; onye nāṅaghari na ọsọ ka i gābu n'uwa. 13Ken we si Jehova, Ahuhu ajọ omumem di uku kari obubu. 14Le, I chupuwom ta n'iru ala; ọ bu kwa n'iru-Gi ka agēzopum; m'gābu kwa onye nāṅaghari na ọsọ n'uwa; o gēru kwa na onye ọ bula nke nāhum gēb͕um. 15Jehova we si ya, N'ihi nka onye ọ bula nke nēb͕u Ken, okpukpu asa ka agābọ ọ́bọ̀ n'aru ya. Jehova we doro Ken ihe-iriba-ama, ka onye ọ bula nke nāhu ya we ghara itib͕u ya.
16Ken we si n'iru Jehova pua, biri n'ala Nod, n'Iru-anyanwu Iden. 17Ken we mara aru nwunye-ya; ọ we turu ime, mua Inok: ma Ken nọ nēwu obodo, o we kpọ aha obodo ahu, dika aha nwa-ya nwoke si di, Inok. 18Ewe mua Irad nye Inok: Irad we mua Mehujael: Mehujael we mua Metushael: Metushael we mua Lemek. 19Lemek we lutara onwe-ya ndinyom abua: aha otù onye nime ha bu Eda, aha nwayi ibe-ya bu Zila. 20Eda we mua Jebel: onye ahu bu nna ndi bi n'ulo-ikwū, ndi nwe-kwa-ra anu-ulo. 21Aha nwa-nne-ya nwoke bu Jubal: onye ahu bu nna ndi nile nākpọ ubọ-akwara, nēb͕u kwa ọ̀jà. 22Zila kwa, nwayi ahu mu-kwa-ra Tubal-ken, onye nākpu ihe-ọlu nile ọ bula nke ọla na nke ígwè: ma nwa-nne-nwayi Tubal-ken bu Neama. 23Lemek we si ndinyom-ya:
Eda na Zila, nurunu olum;
Ndinyom Lemek, genu nti n'okwu-ọnum:
N'ihi na nwoke ka m'b͕uworo n'ihi ob͕ub͕u-mmam,
Ọ bu kwa nwata-nwoke ka m'b͕uworo n'ihi ubiri-utarim:
24Asi na ọ bu okpukpu asa ka agābọ̀ Ken ọ́bọ̀,
Agābọ kwa Lemek ọgu okpukpu atọ na iri na asa.
25Adam we mara aru nwunye-ya ọzọ; nwunye-ya we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Set, si, N'ihi na Chineke doworom nkpuru ọzọ n'ọnọdu Ebel; n'ihi na Ken b͕uru ya. 26Set kwa, ya onwe-ya ka amu-kwa-ra nwa-nwoke nye; ọ kpọ aha-ya Enosh: mb͕e ahu ka amalitere ikpọku aha Jehova.

Nu markerat:

JENESIS 4: IGBOB

Märk

Dela

Kopiera

None

Vill du ha dina höjdpunkter sparade på alla dina enheter? Registrera dig eller logga in

YouVersion använder cookies för att anpassa din upplevelse. Genom att använda vår webbplats accepterar du vår användning av cookies enligt beskrivningen i vår Integritetspolicy