JENESIS 3

3
1Ma agwọ di aghughọ kari anu ọhia ọ bula nke Jehova, bú Chineke, mereri. O we si nwayi ahu, Ọ̀ gābu ezie na Chineke siri, Unu erila nkpuru sitere n'osisi ọ bula nke ubi a ab͕ara ogige? 2Nwayi we si agwọ ahu, Ayi nēri nkpuru osisi nile nke ubi a ab͕ara ogige: 3ma nkpuru nke osisi ahu nke di n'etiti ubi a ab͕ara ogige, Chineke asiwo, Unu erila nkpuru sitere na ya, unu emetukwala ya aka, ka unu we ghara inwu anwu. 4Agwọ we si nwayi, Ọ dighi ọnwu unu nāghaghi inwu: 5n'ihi na Chineke mara na n'ubọchi unu gēri nkpuru sitere na ya, mb͕e ahu ka agēmeghe anya-unu, unu ewe di ka Chineke, nāma ezi ihe na ihe ọjọ. 6Nwayi we hu na osisi ahu di nma ihe-oriri, na ọ bu kwa ihe nāgu anya agu ile, na ihe anāchọsi ike ka osisi ahu bu kwa ime ka madu nwe uche, o were ufọdu nime nkpuru-ya, rie; o nye kwa di-ya, tinyere onwe-ya, o we rie. 7Ewe meghe anya ha abua, ha we mara na ndi b͕a ọto ka ha bu; ha we dukọta akwukwọ osisi fig, mere onwe-ha ihe-ọkiké. 8Ha we nu olu Jehova, bú Chineke, ka Ọ nējeghari n'ubi ahu ab͕ara ogige mb͕e ifufe nēfe n'ubọchi: madu ahu na nwunye-ya we zopu onwe-ha n'iru Jehova, bú Chineke, n'etiti osisi nke ubi ahu ab͕ara ogige. 9Jehova, bú Chineke, we kpọ madu ahu òkù, si ya, Òle ebe i nọ? 10O we si, Anurum olu-Gi n'ubi a ab͕ara ogige, m'we tua egwu, n'ihi na onye b͕a ọtọ ka m'bu; m'we zo onwem. 11O we si, Ònye gosiri gi na onye b͕a ọtọ ka i bu? Ì riwo nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, ka i ghara iri nkpuru sitere na ya? 12Madu ahu we si, Nwayi ahu nke I nyerem ka mu na ya biri, ya onwe-ya nyerem nkpuru sitere n'osisi ahu, m'we rie. 13Jehova, bú Chineke, we si nwayi ahu, Gini bu nka i meworo? Nwayi we si, Agwọ ahu rafurum, m'we rie. 14Jehova, bú Chineke, we si agwọ ahu, N'ihi na i mewo nka, ihe anābu ọnu ka i bu kari anu-ulo nile, na kari anu ọhia nile ọ bula; afọ-gi ka i gēji je ije, ọ bu kwa ájá ka i ganēri ubọchi nile nke ndu-gi: 15iro ka M'gētiye kwa n'etiti gi na nwayi ahu, na n'etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi n'isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n'ikiri-ukwu. 16Nwayi ahu ka Ọ siri, M'gēme ka ihe-nb͕u-gi na itu-ime-gi ba uba nke-uku; n'ihe-nb͕u ka i gāmu umu; n'ebe di-gi nọ ka ọchichọ-gi gādi, ya onwe-ya gāchi kwa gi. 17Adam ka Ọ sikwara, N'ihi na i gewo nti n'olu nwunye-gi, i we rie nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, si, Gi erila nkpuru sitere na ya: ihe anābu ọnu ka ala bu n'ihi gi; n'ihe-nb͕u ka i gēri ihe sitere na ya ubọchi nile nke ndu-gi; 18o bu kwa ogwu na uke ka ọ gēpuru gi; i gēri kwa ihe-ọkukú nke ubi; 19n'ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n'ala; n'ihi na esiri na ya weputa gi; n'ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata. 20Madu ahu we kpọ aha nwunye-ya Iv; n'ihi na nwayi ahu bu nne madu nile nwere ndu. 21Jehova, bú Chineke, we were akpukpọ anu mere Adam, mekwara nwunye-ya, uwe-ime, we yibe ha.
22Jehova, bú Chineke, we si, Le, madu ahu aghọwo ihe di ka otù onye nime ayi, n'ima ezi ihe na ihe ọjọ; ma ub͕u a, ka o we ghara iseti aka-ya, were nkpuru sitere n'osisi ahu nke ndu, rie, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: 23Jehova, bú Chineke, we zipu ya n'ubi Iden ab͕ara ogige, ilu ọlu ala ahu nke esiri na ya weputa ya. 24O we chupu madu ahu, me ka Cherubim nọdu n'akuku Iru-anyanwu nke ubi Iden ab͕ara ogige, ha na ire-ọku nke mma-agha nke nēchighari onwe-ya, ichebe uzọ osisi ahu nke ndu.

Nu markerat:

JENESIS 3: IGBOB

Märk

Dela

Kopiera

None

Vill du ha dina höjdpunkter sparade på alla dina enheter? Registrera dig eller logga in

YouVersion använder cookies för att anpassa din upplevelse. Genom att använda vår webbplats accepterar du vår användning av cookies enligt beskrivningen i vår Integritetspolicy