Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Okwu Chineke Bụ Nke Onwe, Bụrụkwa Nke Ugbu AIhe Atụ

Okwu Chineke Bụ Nke Onwe, Bụrụkwa Nke Ugbu A

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Nzọpụta dị ebe a!

Ò nwetụla mgbe ọ dị gị ka i kwesịrị iru ebe ọhụrụ dị elu iji chọta Chineke?

Ya bụ, e nwere ọkwa ị chọrọ ị nweta n'ụzọ ime mmụọ iji rite ihu ọma Ya?

Onyeozi Pọl nwere ozi ọma ọ chọrọ i zigara unu: Chineke agbadatala n'ebe anyị nọ.

Na Rom 10:6, Pọl nọ na-ekwu okwu site na Diuterọnọmi 30:12, ebe Mozis na-akọwa ọgbụgba ndụ ahụ nye ụmụ Izrel. Laa azụ n'oge ahụ, ndị mmadụ chere na ha kwesịrị ịrịgo n'eluigwe ịnata Okwu Chineke. Ma Pọl kwuru na nke ahụ adịghịzi mkpa. Site n'okwukwe n'ebe Jizọs nọ, ezi omume Chineke bụzi ihe nọ nso.

Nkebi ahịrịokwu a bụ "ònye ga-arịgo n'eluigwe" ọ dị ka ịjụ, sị, "Ònye nwere ike ịrịgo ugwu kachasị elu ịchọta Chineke?"

Mana azịza nke a bụ, na ọ dịghị onye kwesịrị nu! Jizọs esiwo n'eluigwe rịdata n'ụwa, sitekwa n'okwukwe, anyị nwere ike ịnata ezi omume Ya dị ka onyinye.

Otito diri Chineke!

Nzọpụta dị ebe a!

Prayer: Ezi Nna, nyere m aka ịnabata ma nwee obi ụtọ n'ebe onyinye nke ezi omume m natara, nyekwa m amara ịkwụsị ịnwa inweta ya.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Okwu Chineke Bụ Nke Onwe, Bụrụkwa Nke Ugbu A

Echiche Akwụkwọ Nsọ maka Ndị Rom 10:6-10: Mmesi obi ike nke ọnụnọ Chineke na-adịgide adịgide mgbe niile, ịdị nso nke okwu Chineke, ya na oku iji kwupụta Jizọs n'ezie site n'ịkpọsa ọrụ nke ya ọ rụchaworo nye ụwa site n'okwu na omume anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d