Igwa Chineke Okwu N'ekpereIhe Nhụchatụ

AGỤỤ MAKA CHINEKE
IGWA CHINEKE OKWU
Kelee Chineke n'ihi na Ọ hụrụ gị n'anya ma chọọ ka ị mụta ịgwa Ya okwu site n'ekpere. Rịọ Chineke ka O kụziere gị otù esi ekpe ekpere.
IMABÀ N'IME
Mepụta setị kaadị-odide atọ nwere okwu/nkebi-okwu ndị a na ha: nna ochie, ezigbo enyi, pastọ, onye na-ahazi ego na ihe n'ụlọ azụmahịa nri, na nwanne nna onye agbata obi. Kpasaa setị kaadị mbụ n'usoro ka onye ịkachasị ekwusara okwu nọrọ n'elu elu, na ka onye ịna adịghị ekwusakari okwu nọrọ n'ala ala. Hazie setị kaadị nke abụọ n'usoro ahụ, dèbé onye ị kachasị chọọ ka ọ dị gị nso n'elu elu. Hazie setị kaadị nke atọ ka ọ dị n'akụkụ setị kaadị nke abụọ, dèbé onye agụụ ọnịnọ ya kachasị agụ gị ma ọ bụrụ na ọ nọghị gị nso, n'elu elu. Tụlee ka setị kaadị gị gasị si yie onwe ha.
IMIKPỤBANYÈ
Ekpere bụ nnọọ ịgwa Chineke okwu, Onye hụrụ gị n'anya ma chọọ ihe kachasị mma maka gị. Dịka agụụ ọnịnọ onye ị hụrụ n'anya ga-esi wee n'agụ gị ma ọ bụrụ na ọ nọghị gị nso, agụụ Chineke n'agụ mmụọ gị ma ọ bụrụ na ịbịarughị Ya nso n'ekpere. Akwụkwọ Nsọ na-ekwukarị na ụdị agụụ a ka anyị na Chineke nọkọọ dịka inwe akpịrị ịkpọ nkụ ma ọ bụ agụrụ iri nri. Gụọ Abụ Ọma 42: 1–2: "Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, otu a ka agụụ ihe banyere Gị si na-agụ m, O Chineke. Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ́ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?" Ị pụrụ ịgakwuru Chineke n'ekpere wee zute Ya, dị ka mgbada ahụ na-achọta mmiri na iyi mgbe akpịrị na-akpọ ya nkụ.
IGWA IBE ANYI OKWU
- Gịnị ka ịna echè mgbe agụrụ n'agụ gị ma ọ bụ mgbe akpịrị na-akpọ gị nkụ?
- Kedụ ka gị na Chineke ịnọkọ si adị ka nnọkọ gị na onye ị hụrụ n'anya? Kedụ ka o siri dị iche?
- Kedụ ka ịga esi kọwaa ma ọ bụ mara na akpịrị na-akpọ mmụọ gị nkụ ka ya na Chineke nọkọọ?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ndụ èbị́m ezinụlọ nwerè ike ijupụtà n'ịrụ ọrụ, ma ya apụta na anyị enweghị ike iwepụtà oge iji kpee ekpere—ma ofọdụ ichetà inyere ụmụ anyị aka ịzụlite àgwà nke ime ka Chineke soro n'ihe ha n'eme n'ụbọchị. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a, ezinụlọ gị gà-ahụ etú Chineke si chọsiike ịnụ site n'aka anyị na etú ekpere si ewusi mmekọrịta anyị na Ya na ibe anyị, ike. Kwa ụbọchị gụnyerè ihe mkpali ekpere, agụm na nkọwa Akwụkwọ Nsọ dị nkenke, ihe agà eme-eme, na ajụjụ mkparịta-ụka gasị.
More
Ọ ga-amasị anyị ịkele Focus on the Family maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.FocusontheFamily.com