Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ige Chineke ntiIhe Atụ

Listening To God

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

Onye Di na Kọmitii Ndụmọdụ Ime Mmụọ Mgbakọ Gi?

Otụtụ mgbe Chineke ga na-ekwurịta okwu ochịchọ ya na amamihe site n'aka ụmụazụ Kraịst ndị ọzọ! Enweghi m ike ịmalite ịgụta oge Chineke jiri Onye Kraịst ọzọ wee nweta ozi n’obi m! A na m anụ ọkpanya ya site n’aka ndị ozuzu aturu m, pọdkastị, ndị enyi m, ụmụ m, ndi odide intaneti, ma ọ bụ onye ọzọ n’ime LifeGroup. M na-ele ụfọdụ n'ime ha anya dị ka Kọmitii Ndụmọdụ Ime Mmụọ. Ndị a bụ: nwunye m, onye ndụmọdụ, onye ekpere, enyi, na ndị mụrụ m.

Kedu maka gị? I na-achọ ma na-ege ntị nke ọma na ndị kwere ekwe ndị ọzọ ị na-asọpụrụ? Nọgide na-eso ndị Kraịst ndị ọzọ na-emekọrịta ihe (ọkachasị ndị na-eto ma na-agbakwasị ụkwụ na Okwu Chineke) dị mkpa maka njem okwukwe nke aka gị.

Ige ha ntị ezughị, n'agbanyeghị. I na-etinyekarị ma ọ bụ tinye n'ọrụ ndụmọdụ ma ọ bụ amamihe ị nụrụ?

Jiri amamihe ma nọsie ike na ọgbakọ Ndị Kraịst! Gee ndị ezinụlọ okwukwe gị ntị. Anyị chọrọ ha, ha chọkwara gị. Ihe ogugu taa si n’Ilu 18: 2 na-agwa anyi hoo haa na o di njo ka ibu “mara-ihe nile.”

Onwe m, achọghị m igwu onye nzuzu. A chọrọ m enyemaka. Achọrọ m amamihe. Achọrọ m ịhọrọ ịnọgide na-adị umeala n’obi ma bụrụkwa nke a pụrụ ịkụziri ihe ka m wee nụ nduzi, mgbazi na ịhụnanya nke Chineke. Achọrọ m ka obi m dịrị na umeala ma bụrụkwa onye a pụrụ ịkụzi ihe — nihi na Chineke ga-agwa anyị okwu oge niile site n'aka ụmụ Ya ndị ọzọ.

Jụọ Nna ahụ: Onye kwesịrị ịnọ na Kọmitii Ndụmọdụ Ime Mmụọ Mgbakọ m?

Nkwupụta egwu ofufe nke oge a: "Set a Fire" site na Will Reagan na United Pursuit

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Listening To God

Amy Groeschel dere nhazi akwukwo nso a ruru ubochi asaa. Olile anya o jiri dee ya bu ka aghota ya site na obi Nna anyi huru anyi na anya rute na obi gi. Ekpere ya bu ka okuzie ka esi a hapu echiche na ebute mkpotu ogu na obi anyi ka, werekwa mee ka anyi tinye obi na olu Chineke.

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: www.life.church