Nyè Ọrụ Gị Uru Ziri EziIhe Nhụchatụ

Ihe Ọrụ Anyị Pụtarà Bụ̀ Nhọrọ Anyị
Na Jenesis 37:5-7 na 9, Josef rọrọ nrọ banyere oké ọkpụkpọ-òkù Chineke tinyerè na ndụ ya. Ọ rọrọ nrọ na ya ga-anọ n’ọchịchị ka ọbụna ndị ezinụlọ ya gakpọ isiala nye ya. Ụmụnna ya nwerè ekworo wee chọọ igbu ya. Mgbe ha nọ n’ebe dị anya ma Josef ewee pụta naanị ya ka ọ mara ka ha dị, ha weerè ohere ahụ repú ya ka ọ bụrụ ohu. Ị nwere ike isi na nrọ Josef ahụ, nwetarà mgbanwe dị ukwuu.
Amanyerè Josef ịrụ ọrụ dị ka ohu n’ala ọzọ ebe ndị mmadụ n'enweghị nkwanye ùgwù nye Chineke, mana ha apụghị ịnapụ ya nnwere-onwe ịhọrọ otù o ga-esi debe obi ya n'arụ ọrụ ya. Josef ekweghị ka ọrụ enyerè ya mee ka ọ ghọọ ụdị mmadụ ọ n'abụghị. N'agbanyeghị na onyeisi ya bụ Pọtịfa, Josef họọrọ ijere Chineke ozi na ịrụ ọrụ ya nke ọma. N’ihi ya, Chineke mere ka Josef nwee ihe ịga nke ọma n’ihe niile o merè, Pọtịfa wee mee Josef onye na-elekọta ihe niile o nwere.
Anyị niile nwere nrọ gasị banyere ụdị ọrụ anyị chọrọ ịrụ. Ikekwe ọrụ ị na-arụ ugbu a dị nnọọ ezigbo anya na ụdị ọrụ ị chọrọ ịrụ. N'agbanyeghị nke ahụ, anyị niile na-ahọrọ — n'amaghị ama ma ọ bụ ná nkpacha anya — ihe ọrụ anyị pụtara nye anyị. Uru anyị na-enye ọrụ anyị na-ekpebi àgwà anyị nwerè banyere ya, bụ́ nke na-emetụta ịdị nma na ịma mma anyị na-eweta n’ọrụ anyị, nke ahụ na-emetụtakwa otú Chineke pụrụ isi jiri anyị rụọ ọrụ.
Anyị nwerè nnwere-onwe ịhọrọ ezi uru maka ọrụ anyị n'arụ. Mgbe anyị na-eme nke a, anyị nwere ike a bụghị naanị ịrụ ọrụ anyị nke ọma, anyị gà ekwekwa ka ndị ọzọ hụ Kraịst n'ime anyị. Nke bụ́ isiokwu bụ̀, ezi ndị anyị bụ̀, dị n'ime Kraịst, ọ bụghị n'ọrụ anyị n'arụ. Rịọ Chineke ka O gosi gị ihe ọrụ i n'arụ pụtara nye Alaeze Ya.
Ekpere
Chineke Nna, ụbọchị taa, nyere m aka ịhụ ọrụ m dịka Ị si ahụ ya. Nyere m aka ichetà na Ị na-eji ọrụ niile m na-arụ nke ọma n’ihi ịhụnanya m nwere n’ebe Ị nọ n'egosi ndị ọzọ ịhụnanya Kraịst. Ka ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ hụ Kraịst n’ime m taa. N'aha Jizọs. Amen.
Maka Nchọgharị Ndị Ọzọ
Chọta kà anyị ga-esi chọta nzube Chineke maka anyị n'ime ọbụna ọrụ nkịtị anyị n'arụ na ebe a Workmatters blog.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọtụtụ n'ime anyị ga-eji ihe gafere ọkara ndụ nke ntorobịa anyị n'arụ ọrụ. Anyị chọrọ ima na o nwerè ihe ọrụ anyị n'arụ pụtara — na ọrụ anyị n'arụ bara uru. Mana nrụgide, ihe gasị a chọrọ ka anyị mee, na ihe mgberede nwere ike ime ka anyị hụ ọrụ dịka ihe siri ike — ihe anyị n'agaghị eji obi anyị niile wee mee. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enyere gị aka imata ike i nwerè ịhọrọ uru ziri ezi maka ọrụ gị dị mgbọrọgwụ na okwukwe.
More