ZEKARAIA 4:1-14
ZEKARAIA 4:1-14 Bible Nso (IGBOB)
Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we biaghachi, kpọtem, dika onye anākpọte n'ura-ya. O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we si, Ahuwom, ma, le, ihe-idọba-oriọna, nke bu nání ọla-edo ọla-edo, ya na ọkwa-ya n'isi-ya, na oriọna asa n'elu ya: ihe asa eji ab͕aye manu diri oriọna nile n'otù n'otù, bú nke di n'isi-ya: osisi olive abua di kwa n'akuku ya, otù n'aka-nri ọkwa ahu, na otù n'aka-ekpe-ya. M'we za, gwa mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, si, Ndia bu gini, onye-nwem? Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we za, sim, Ì maghi ihe ndia bu? M'we si, É-è, onye-nwem. O we za, gwam okwu, si, Nka bu okwu Jehova nke Ọ gwara Zerubabel, si, Ọ bughi site n'usu-ndi-agha, ọ bughi kwa site n'ike, kama ọ bu site na Mọm, ka Jehova nke usu-ndi-agha siri. Ònye ka i bu, gi oké ugwu? n'iru Zerubabel i gāghọ ebe di lari: ọ gēweputa kwa nkume nke-elu n'itiri ya oké nkpu, si, Amara, amara. Okwu Jehova we ruem nti, si, Aka abua nke Zerubabel atọwo ntọ-ala nke ulo a, aka-ya abua gēwubì kwa ya; i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu. N'ihi na ònye ledaworo ubọchi ihe ntà anya? n'ihi na ha gāṅuri ọṅu, hu nkume eji atù mb͕idi n'aka Zerubabel, bú asa ndia, ndi bu anya Jehova; ndi ahu nējeghari n'uwa nile. M'we za, si ya, Gini bu osisi olive abua ndia nke di n'aka-nri ebe-idọba-oriọna nka na n'aka-ekpe-ya? M'we za nke ub͕ò abua, si ya, Gini bu ngalaba abua nke osisi olive ndia nke nēsi n'ihe ọla-edo abua eji ab͕apu manu b͕apu manu ọla-edo n'onwe-ha? O we gwam okwu, si, I maghi ihe ndia bu? M'we si, É-è, onye-nwem. Ọ si, Ndia bu umu-ndikom abua nke manu ọhu, ndi nēguzo n'akuku Onye-nwe uwa nka nile.
ZEKARAIA 4:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu lọghachiri kpọtee m, dịka e si akpọte onye nọ nʼụra. Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ana m ahụ ihe ịdọba oriọna e ji ọlaedo mee. O nwere ọkwa nʼisi ya, nweekwa oriọna asaa, nke na-enwu nʼelu ya. Oriọna asaa ndị a nwekwara okporo asaa e si agbanye mmanụ nʼime ha. Ahụkwara m osisi oliv abụọ nke dị nʼakụkụ ihe ịdọba oriọna ahụ. Otu dị nʼotu akụkụ ya, nke ọzọ, nʼakụkụ nke ọzọ.” A sịrị m mmụọ ozi ahụ na-ekwuru m okwu, “Nna m ukwu, gịnị ka nke a pụtara?” Mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sịrị m, “Ị na-ekwu na ị maghị ihe ha bụ?” Azara m sị, “Ee, nna m ukwu, amaghị m.” Ọ sịrị m, “Nke a bụ okwu nke ONYENWE ANYị nye Zerubabel. ‘Ọ bụghị site nʼike, maọbụ site nʼume, kama ọ bụ site na Mmụọ m,’ ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Gịnị ka ị bụ, gị ugwu dị ukwuu? Ị ga-aghọ ala dị larịị nʼihu Zerubabel. Mgbe ahụ, ọ ga-awapụta isi nkume ahụ site nʼiti oke mkpu ọṅụ, ‘Amara! Amara dịrị ya!’ ” Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYị ruru m ntị sị, “Zerubabel wara ntọala ụlọnsọ ukwu a, ọ bụ ya ga-ewuchakwa ya. Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu. “Onye na-eleda ụbọchị ihe nta anya ebe ọ bụ nʼanya asaa nke ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ejegharị na-elezu ụwa dum, ga-aṅụ ọṅụ mgbe ha hụrụ nkume eji atụ mgbidi nʼaka Zerubabel?” Mgbe ahụ, a sịrị m ya, “Gịnị bụ osisi oliv abụọ ahụ dị nʼaka nri na nʼaka ekpe ihe ịdọba oriọna ahụ?” A sịkwara m ya nke ugboro abụọ, “Gịnị bụ alaka osisi oliv abụọ ndị a dị nʼakụkụ okporo ọlaedo abụọ ahụ, nke e si na ha na-awụpụta mmanụ ọlaedo?” Ọ sịrị m, “Ọ pụtara na ị maghị ihe ha bụ?” Asịrị m, “Mba, nna m ukwu.” Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ndị a bụ mmadụ abụọ a họpụtara tee mmanụ, ife ya ofufe bụ Onyenwe ụwa niile.”