Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Zekaraya 4

4
Osisi oliv abụọ na ihe ịdọba oriọna
1Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu lọghachiri kpọtee m, dịka e si akpọte onye nọ nʼụra. 2Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?”
Asịrị m, “Ana m ahụ ihe ịdọba oriọna e ji ọlaedo mee. O nwere ọkwa nʼisi ya, nweekwa oriọna asaa, nke na-enwu nʼelu ya. Oriọna asaa ndị a nwekwara okporo asaa e si agbanye mmanụ nʼime ha. 3Ahụkwara m osisi oliv abụọ nke dị nʼakụkụ ihe ịdọba oriọna ahụ. Otu dị nʼotu akụkụ ya, nke ọzọ, nʼakụkụ nke ọzọ.”
4A sịrị m mmụọ ozi ahụ na-ekwuru m okwu, “Nna m ukwu, gịnị ka nke a pụtara?”
5Mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sịrị m, “Ị na-ekwu na ị maghị ihe ha bụ?”
Azara m sị, “Ee, nna m ukwu, amaghị m.”
6Ọ sịrị m, “Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị nye Zerubabel. ‘Ọ bụghị site nʼike, maọbụ site nʼume, kama ọ bụ site na Mmụọ m,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
7“Gịnị ka ị bụ, gị ugwu dị ukwuu? Ị ga-aghọ ala dị larịị nʼihu Zerubabel. Mgbe ahụ, ọ ga-awapụta isi nkume ahụ site nʼiti oke mkpu ọṅụ, ‘Amara! Amara dịrị ya!’ ”
8Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị sị, 9“Zerubabel wara ntọala ụlọnsọ ukwu a, ọ bụ ya ga-ewuchakwa ya. Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu.
10“Onye na-eleda ụbọchị ihe nta anya ebe ọ bụ nʼanya asaa nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ejegharị na-elezu ụwa dum, ga-aṅụ ọṅụ mgbe ha hụrụ nkume eji atụ mgbidi nʼaka Zerubabel?”
11Mgbe ahụ, a sịrị m ya, “Gịnị bụ osisi oliv abụọ ahụ dị nʼaka nri na nʼaka ekpe ihe ịdọba oriọna ahụ?”
12A sịkwara m ya nke ugboro abụọ, “Gịnị bụ alaka osisi oliv abụọ ndị a dị nʼakụkụ okporo ọlaedo abụọ ahụ, nke e si na ha na-awụpụta mmanụ ọlaedo?”
13Ọ sịrị m, “Ọ pụtara na ị maghị ihe ha bụ?”
Asịrị m, “Mba, nna m ukwu.”
14Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ndị a bụ mmadụ abụọ a họpụtara tee mmanụ, ife ya ofufe bụ Onyenwe ụwa niile.”

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Zekaraya 4: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye