NDI ROM 10:9-11
NDI ROM 10:9-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị. Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị. Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
Kesaa
Gụọ NDI ROM 10NDI ROM 10:9-11 Bible Nso (IGBOB)
na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gí: n'ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa. N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Onye ọ bula nke kwere na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya.
Kesaa
Gụọ NDI ROM 10