Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ndị Rom 10

10
1Ụmụnna m, ihe na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwu na ekpere m na-ekpe nye Chineke bụ ịhụ na a zọpụtara ha. 2Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nʼobi nke ukwuu. Kama ịnụ ọkụ nʼobi ha abụghị site na mmazu Chineke. 3Ebe ha na-amaghị ezi omume nke si na Chineke bịa kama ha chọrọ ihiwe nke onwe ha, ha ewedaghị onwe ha nʼokpuru ezi omume nke Chineke. 4Kraịst bụ ọgwụgwụ iwu. Ya mere, ezi omume ga-adịrị onye ọbụla nke kwere.
Ama Mosis gbara banyere idebe iwu
5Mosis si otu a dee banyere ezi omume nke sitere nʼiwu, “Onye ọbụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ site na ha.”#10:5 Lev 18:5 6Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’ ”#10:6 Dit 30:12 (nke bụ, ikudata Kraịst) 7“maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ”#10:7 Dit 30:13 (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). 8Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,”#10:8 Dit 30:14 ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa. 9Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị. 10Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị. 11Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”#10:11 Aịz 28:16 12Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, ọ na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke. 13Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.”#10:13 Jul 2:32
14Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị? 15Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.”#10:15 Aịz 52:7
16Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?”#10:16 Aịz 53:1 17Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst. 18Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie.
“Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo,
okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”#10:18 Abụ 19:4
19Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị,
“Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu;
aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.”#10:19 Dit 32:21
20Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị,
“Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m,
ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.”#10:20 Aịz 65:1
21O kwuru banyere ndị Izrel,
“Agbasara m aka m ogologo ụbọchị niile
nye ndị nnupu isi na ndị na-ekwesị olu ike.”#10:21 Aịz 65:2

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Ndị Rom 10: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye