NDI ROM 10:17-21
NDI ROM 10:17-21 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere, okwukwe si n'ọnunu puta, ma ọnunu ahu sitere n'okwu Kraist. Ma asim, Ọ̀ gābu na ha anughi? Ha nuru ezie, N'uwa nile ka olu-ha puru jezue, Na nsọtu nile nke elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue. Ma asim, Ọ̀ gābu na Israel amaghi? Moses buru uzọ si, Mu onwem gēwere mba nābughi mba kpasue unu ekworo, Mba nēnweghi nghọta ka M'gēwere kpasue unu iwe. Ma Aisaia nwere anya-ike nke-uku, we si, Ndi nāchọghm chọtaram; Ewerem gosi ndi nājughi ajuju n'akam. Ma Ọ nēkwu okwu bayere Israel, si, Ogologo ubọchi dum ka M'b͕asara akam nye ndi nādighi-ekwenye, ndi nēkwugidekwam.
NDI ROM 10:17-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst. Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie. “Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.” Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị, “Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu; aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.” Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị, “Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m, ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.” O kwuru banyere ndị Izrel, “Agbasara m aka m ogologo ụbọchị niile nye ndị nnupu isi na ndị na-ekwesị olu ike.”