Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI ROM 10:1-21

NDI ROM 10:1-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ụmụnna m, ihe na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwu na ekpere m na-ekpe nye Chineke bụ ịhụ na a zọpụtara ha. Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nʼobi nke ukwuu. Kama ịnụ ọkụ nʼobi ha abụghị site na mmazu Chineke. Ebe ha na-amaghị ezi omume nke si na Chineke bịa kama ha chọrọ ihiwe nke onwe ha, ha ewedaghị onwe ha nʼokpuru ezi omume nke Chineke. Kraịst bụ ọgwụgwụ iwu. Ya mere, ezi omume ga-adịrị onye ọbụla nke kwere. Mosis si otu a dee banyere ezi omume nke sitere nʼiwu, “Onye ọbụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ site na ha.” Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’ ” (nke bụ, ikudata Kraịst) “maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,” ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa. Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị. Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị. Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.” Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, ọ na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke. Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.” Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị? Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.” Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?” Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst. Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie. “Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.” Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị, “Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu; aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.” Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị, “Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m, ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.” O kwuru banyere ndị Izrel, “Agbasara m aka m ogologo ụbọchị niile nye ndị nnupu isi na ndị na-ekwesị olu ike.”

NDI ROM 10:1-21 Bible Nso (IGBOB)

Umu-nnam, ihe di obim ezi nma na aririọ m'nāriọ Chineke n'ihi ha bu, ka azọputa ha. N'ihi na anamab͕ara ha àmà na ha nānu ọku n'obi n'ebe Chineke nọ, ma ọ bughi dika nmazu si di. N'ihi na, ebe ha nāmaghi ezi omume Chineke, nāchọ kwa uzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzo, ha edoghi onwe-ha n'okpuru ezi omume Chineke. N'ihi na Kraist bu nsọtu iwu iwetara onye ọ bula nke kwere ezi omume. N'ihi na Moses edewo n'akwukwọ na madu nke nēme ezi omume nke sitere n'iwu gādi ndu nime ya. Ma ezi omume ahu nke sitere n'okwukwe nēkwu otú a, si, Asila n'obi-gi, Ònye gārigo n'elu-igwe? (nke ahu bu, ikudata Kraist:) ma-ọbu, Ònye gārida n'abyss ahu? (nke ahu bu, isi na ndi nwuru anwu kugota Kraist.) Kama ọ̀ bu gini ka ọ nēkwu? Okwu ahu di gi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi: nke ahu bu, okwu okwukwe, nke ayi nēkwusa: na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gí: n'ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa. N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Onye ọ bula nke kwere na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya. N'ihi na ọ dighi ihe di iche n'etiti onye-Ju na onye-Grik: n'ihi na otù Onye-nwe-ayi ahu bu Onye-nwe ọra madu, buru kwa Onye nwere àkù ri nne inye ndi nile nākpọku Ya: n'ihi na, Onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya. Hà gēsi kwa aṅa kpọku Onye ahu ha akēkweghi na Ya? ma hà gēsi aṅa kwere n'Onye ahu ha akānughi okwu-Ya? ma hà gēsi aṅa nu ma onye nēkwusa anọghi? ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe! Ma ọ bughi ha nile ṅara ozi ọma ahu nti. N'ihi na Aisaia nāsi, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo? Ya mere, okwukwe si n'ọnunu puta, ma ọnunu ahu sitere n'okwu Kraist. Ma asim, Ọ̀ gābu na ha anughi? Ha nuru ezie, N'uwa nile ka olu-ha puru jezue, Na nsọtu nile nke elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue. Ma asim, Ọ̀ gābu na Israel amaghi? Moses buru uzọ si, Mu onwem gēwere mba nābughi mba kpasue unu ekworo, Mba nēnweghi nghọta ka M'gēwere kpasue unu iwe. Ma Aisaia nwere anya-ike nke-uku, we si, Ndi nāchọghm chọtaram; Ewerem gosi ndi nājughi ajuju n'akam. Ma Ọ nēkwu okwu bayere Israel, si, Ogologo ubọchi dum ka M'b͕asara akam nye ndi nādighi-ekwenye, ndi nēkwugidekwam.