NDI ROM 10:1-11
NDI ROM 10:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụmụnna m, ihe na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwu na ekpere m na-ekpe nye Chineke bụ ịhụ na a zọpụtara ha. Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nʼobi nke ukwuu. Kama ịnụ ọkụ nʼobi ha abụghị site na mmazu Chineke. Ebe ha na-amaghị ezi omume nke si na Chineke bịa kama ha chọrọ ihiwe nke onwe ha, ha ewedaghị onwe ha nʼokpuru ezi omume nke Chineke. Kraịst bụ ọgwụgwụ iwu. Ya mere, ezi omume ga-adịrị onye ọbụla nke kwere. Mosis si otu a dee banyere ezi omume nke sitere nʼiwu, “Onye ọbụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ site na ha.” Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’ ” (nke bụ, ikudata Kraịst) “maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,” ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa. Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị. Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị. Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
NDI ROM 10:1-11 Bible Nso (IGBOB)
Umu-nnam, ihe di obim ezi nma na aririọ m'nāriọ Chineke n'ihi ha bu, ka azọputa ha. N'ihi na anamab͕ara ha àmà na ha nānu ọku n'obi n'ebe Chineke nọ, ma ọ bughi dika nmazu si di. N'ihi na, ebe ha nāmaghi ezi omume Chineke, nāchọ kwa uzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzo, ha edoghi onwe-ha n'okpuru ezi omume Chineke. N'ihi na Kraist bu nsọtu iwu iwetara onye ọ bula nke kwere ezi omume. N'ihi na Moses edewo n'akwukwọ na madu nke nēme ezi omume nke sitere n'iwu gādi ndu nime ya. Ma ezi omume ahu nke sitere n'okwukwe nēkwu otú a, si, Asila n'obi-gi, Ònye gārigo n'elu-igwe? (nke ahu bu, ikudata Kraist:) ma-ọbu, Ònye gārida n'abyss ahu? (nke ahu bu, isi na ndi nwuru anwu kugota Kraist.) Kama ọ̀ bu gini ka ọ nēkwu? Okwu ahu di gi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi: nke ahu bu, okwu okwukwe, nke ayi nēkwusa: na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gí: n'ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa. N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Onye ọ bula nke kwere na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya.