Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 89:38-52

ABÙ ỌMA 89:38-52 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa, i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ. Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala. Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu, i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa. Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere. Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo. I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu; mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ. I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ, i nyereghị ya aka mgbe agha dara. I meela ka ịma mma ya gwụsịa. Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala. I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ. I ji ihere dịka akwa kpuchie ya. Ruo ole mgbe ONYENWE ANYị, ka ị ga-ezonarị onwe gị? Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ? Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa. Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile! Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? Sela O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị, nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi? Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya, otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile. O ONYENWE ANYị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo, nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ. Otuto dịrị ONYENWE ANYị ruo mgbe ebighị ebi. Amen na Amen.