Ma Gi onwe-gi achipuwo, ju kwa aju. I wesabigawo onye-Gi etere manu iwe ókè. I sọwo ọb͕ub͕a-ndu nke orù-Gi oyi: I mewo ka okpu-eze-ya ghara idi nsọ ọbuná rue ala. I tiwawo ogige-ya nile; I mewo ka ebe-ya nile ewusiri ike buru ihe dapiara adapia. Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ apunarawo ya ihe: Ọ ghọworo ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ita-uta. I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu; I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria. Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu, I meghi kwa ka o guzosie ike n'agha. I mewo ka onwunwu-ọcha-ya kwusi, I tudawo kwa oche-eze-ya rue ala. I bilatawo ubọchi nile ọ bu okorọbia: I werewo ihere kpuchie ya n'aru. Selah Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēzobe onwe-gi ebighi-ebi? Rùe ole mb͕e ka ọnuma-Gi ganēre dika ọku? Cheta otú mb͕e ndu mu onwem di nkpunkpu: Ọ̀ bu ihe-efu gini ka I kèworo umu madu nile nye? Òle nwoke ọ bu nke gādi ndu, ghara ihu ọnwu anya, Nke gēme ka nkpuru-obi-ya wepuga onwe-ya n'aka ala-mọ? Selah Òle ebe ebere, mbu Gi nile di. Onye-nwe-ayi, Nke I ṅuru Devid iyi bayere ha n'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi? Onye-nwe-ayi, cheta ita-uta ndi-orù-Gi; Eburuwom n'obim ita-uta nke ndi nile di iche iche bara uba; Nke ndi-iro-Gi jiworo ta uta, Jehova, Nke ha jiworo ta nzọ-ukwu nile nke onye-Gi etere manu uta. Onye agọziri agọzi ka Jehova bu rue mb͕e ebighi-ebi. Amen, na Amen.
Gụọ ABÙ ỌMA 89
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 89
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 89:38-52
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo