ABÙ ỌMA 89:1-8
ABÙ ỌMA 89:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya ONYENWE ANYị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị. Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe. Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị, ‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela O ONYENWE ANYị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ. Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere ONYENWE ANYị? Onye yiri ONYENWE ANYị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile? Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu. O ONYENWE ANYị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? Gị, O ONYENWE ANYị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu.
ABÙ ỌMA 89:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Ebere nile nke jehova ka m'gābù abù-ha rue mb͕e ebighi-ebi: Ọb͕ọ nile ka m'gēwere ọnum me ka ha mara ikwesi-ntukwasi-obi-Gi. N'ihi na asiwom, Rue mb͕e ebighi-ebi ka agēwuli ebere elu dika ulo; Elu-igwe, I gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi guzosie ike nime ha. Mu na onye M'rọputara ab͕awo ndu, Aṅuworom Devid, bú orùm, iyi; Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme ka nkpuru-gi guzosie ike, M'gēwu kwa oche-eze-Gi rue ọb͕ọ nile. Selah Elu-igwe gēkele kwa oké ọlu-Gi, Jehova; Kele kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nime nkpọkọta nke ndi nsọ. N'ihi na ònye nime mbara-ígwé ka agēji turu Jehova? Ònye yiri Jehova n'etiti umu Chineke? Ọ bu Chineke Nke anāmara jijiji ri nne n'ìzù nzuzo nke ndi nsọ, Ọ bu kwa Onye anātu egwu Ya kari ndi nile di Ya buruburu. Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, Ònye di ike dika Gi, Ja? Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di kwa Gi buruburu.