Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya ONYENWE ANYị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị. Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe. Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị, ‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela O ONYENWE ANYị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ. Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere ONYENWE ANYị? Onye yiri ONYENWE ANYị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile? Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu. O ONYENWE ANYị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? Gị, O ONYENWE ANYị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu.
Gụọ Abụ Ọma 89
Geere nke a ntị Abụ Ọma 89
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 89:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo