ABÙ ỌMA 89:1-37
ABÙ ỌMA 89:1-37 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya ONYENWE ANYị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị. Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe. Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị, ‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela O ONYENWE ANYị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ. Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere ONYENWE ANYị? Onye yiri ONYENWE ANYị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile? Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu. O ONYENWE ANYị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? Gị, O ONYENWE ANYị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu. Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ; mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ. Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị. Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya. Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị. Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu. Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị. Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ, ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O ONYENWE ANYị. Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile; ha na-aṅụrị nʼezi omume gị. Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha, site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu. Nʼezie, ọta anyị bụ nke ONYENWE ANYị, eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel. I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ, nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị: “Enyela m otu onye dị ike agha ike; Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m. Achọtala m Devid ohu m, were mmanụ nsọ m tee ya. Aka m ga-agba ya ume; nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike. Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede; ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya. Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya. Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi. Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya, site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu. M ga-edo aka ya nʼoke osimiri, dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile. Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’ Aga m eme ya nwa mbụ m, onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ. Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa. Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide. “Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya, gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile, ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya, hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu, aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha, tikwaa ha ụtarị maka njehie ha; ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ. Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m. Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m. Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta. Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie na m apụghị ịghara Devid ụgha, na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide. Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa. E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” Sela
ABÙ ỌMA 89:1-37 Bible Nso (IGBOB)
Ebere nile nke jehova ka m'gābù abù-ha rue mb͕e ebighi-ebi: Ọb͕ọ nile ka m'gēwere ọnum me ka ha mara ikwesi-ntukwasi-obi-Gi. N'ihi na asiwom, Rue mb͕e ebighi-ebi ka agēwuli ebere elu dika ulo; Elu-igwe, I gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi guzosie ike nime ha. Mu na onye M'rọputara ab͕awo ndu, Aṅuworom Devid, bú orùm, iyi; Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme ka nkpuru-gi guzosie ike, M'gēwu kwa oche-eze-Gi rue ọb͕ọ nile. Selah Elu-igwe gēkele kwa oké ọlu-Gi, Jehova; Kele kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nime nkpọkọta nke ndi nsọ. N'ihi na ònye nime mbara-ígwé ka agēji turu Jehova? Ònye yiri Jehova n'etiti umu Chineke? Ọ bu Chineke Nke anāmara jijiji ri nne n'ìzù nzuzo nke ndi nsọ, Ọ bu kwa Onye anātu egwu Ya kari ndi nile di Ya buruburu. Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, Ònye di ike dika Gi, Ja? Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di kwa Gi buruburu. Gi onwe-gi nāchi nbili-elu nke oké osimiri: Mb͕e nmali-miri-ya nile nēbuli onwe-ha elu, Gi onwe-gi nēme ka ha dajua. Gi onwe-gi azọpiawo Rehab, dika onye eb͕uru eb͕u; I werewo ogwe-aka nke ike-Gi chusa ndi-iro-Gi. Gi nwe elu-igwe, Gi nwe kwa uwa: Elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya, Gi onwe-gi atọwo ntọ-ala-ha. Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha: Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n'aha-gi. Gi nwere ogwe-aka nke idi-ike di nime ya: Aka-Gi di ike, aka-nri-Gi di elu. Ezi omume na ikpe ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Gi: Ebere na ezi-okwu nāga n'iru Gi. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu nke mara olu iti-nkpu ahu: Jehova, n'ìhè nke iru-Gi ka ha nēje ije. N'aha-Gi ka ha nēteghari egwú ọṅù ogologo ubọchi nile: Ọ bu kwa n'ezi omume-Gi ka ha nādi elu. N'ihi na ima-nma nke ike-ha ka I bu: Ọ bu kwa n'utọ ihe-ayi nātọ Gi ka mpi-ayi nādi elu. N'ihi na Jehova nwe ọta-ayi; Ọ bu kwa Onye Nsọ nke Israel nwe eze-ayi. Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù, Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike; Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu. Achọtawom Devid, bú orùm; Ewerewom manu nsọm te ya: Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ; Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume. Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede; Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala. M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya, Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe. Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya: Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu. M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri, Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile. Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu, Chinekem, na oké nkume nke nzọputam. Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam, Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ. Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēdebere ya eberem, Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi. M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi, Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe. Ọ buru na umu-ya arapu iwum, Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile; Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ, Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu; M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha, Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha. Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem, M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim. M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ, Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta. Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi; M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli; Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi, Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum. Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi; Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi. Selah