Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 89:1-37

Abụ Ọma 89:1-37 BIU

Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya ONYENWE ANYị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị. Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe. Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị, ‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela O ONYENWE ANYị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ. Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere ONYENWE ANYị? Onye yiri ONYENWE ANYị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile? Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu. O ONYENWE ANYị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? Gị, O ONYENWE ANYị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu. Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ; mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ. Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị. Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya. Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị. Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu. Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị. Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ, ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O ONYENWE ANYị. Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile; ha na-aṅụrị nʼezi omume gị. Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha, site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu. Nʼezie, ọta anyị bụ nke ONYENWE ANYị, eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel. I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ, nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị: “Enyela m otu onye dị ike agha ike; Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m. Achọtala m Devid ohu m, were mmanụ nsọ m tee ya. Aka m ga-agba ya ume; nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike. Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede; ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya. Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya. Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi. Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya, site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu. M ga-edo aka ya nʼoke osimiri, dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile. Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’ Aga m eme ya nwa mbụ m, onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ. Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa. Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide. “Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya, gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile, ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya, hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu, aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha, tikwaa ha ụtarị maka njehie ha; ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ. Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m. Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m. Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta. Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie na m apụghị ịghara Devid ụgha, na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide. Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa. E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” Sela