ABÙ ỌMA 81:1-16
ABÙ ỌMA 81:1-16 Bible Nso (IGBOB)
Tikuenu Chineke, bú ike-ayi, nkpu ọṅụ: Tikusienu Chineke nke Jekob nkpu ọṅụ ike. Bulienu abù ọma, weta kwa egwú-otiti, Na ubọ-akwara di utọ, ya na une. Fùanu opì-ike n'ọnwa ọhu, N'ọnwa ndọzu, n'ubọchi ememe-ayi. N'ihi na ukpuru enyere Israel ka ọ bu, Ọ bu ikpe Chineke nke Jekob kpere. Ihe-àmà nime Josef ka O doro ya, Mb͕e Ọ putara imegide ala Ijipt: Ọ bu okwu-ọnu nke otù onye m'nāmaghi ka m'nānu. Ewezugaram ubu-ya n'ibu: Ọbu-aka-ya abua nēsi n'abọ gabiga. Na nkpab͕u i kpọkurum, M'we naputa gi; Anamaza gi n'ebe-nzuzo nke éb͕è-elu-igwe; Anamanwa gi n'akuku miri Meriba. Selah Nuru, ndim, M'gāb͕a àmà megide gi: Israel, ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na i gēgem nti! Ọ dighi chi ala ọzọ gādi nime gi; I gaghi-akpọ kwa isi ala nye chi mba ọzọ. Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, Nke nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa: Meghe ọnu-gi ka ọ sa mbara, M'gēmeju kwa ya. Ma ndim egeghi nti olum; Israel ekweghikwam. M'we zilaga ha n'isi-ike nke obi-ha, Ka ha we nējeghari na ndum-ọdu nile ha. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndim ganēgem nti, Ma asi na Israel gēje ije n'uzọm nile! Nwa mb͕e ka M'gēji me ka ndi-iro-ha ruru ala, Ọ bu kwa imegide ndi nākpab͕u ha ka M'gēchighari akam. Ndi nākpọ Jehova asi gērube isi aghughọ n'okpuru Ya: Ma mb͕e-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi. Ọ gēme kwa ka ha rie abuba ọka wheat: Ọ bu kwa manu-aṅu nke sitere n'oké nkume ka M'gēji nyeju gi afọ.
ABÙ ỌMA 81:1-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Bụkuo Chineke bụ ike anyị abụ ọṅụ, tikusie Chineke Jekọb mkpu ike! Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu, kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une. Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị; nke a bụ iwu dịrị Izrel, ụkpụrụ Chineke nke Jekọb. O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef mgbe ọ pụrụ imegide Ijipt. Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị: “Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha; aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ. Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu, azara m unu site nʼegbe eluigwe; anwara m unu na mmiri nke Meriba. Sela “Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị, a sịkwarị na unu ga-ege m ntị, unu ndị Izrel! Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu; unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ. Abụ m ONYENWE ANYị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya. “Ma ndị m ekweghị ige m ntị. Izrel emekwaghị dịka m gwara ha. Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha, ka ha soro nchepụta nke echiche ha. “Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị, a sịkwa na Izrel ga-eso ụzọ m niile. Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha. Aga m eweli aka m, megide ndị iro ya niile. Ndị niile kpọrọ ONYENWE ANYị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ. Ịta ahụhụ ha ga-adịgidekwa, ruo ebighị ebi. Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ; aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ.”