Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 80:1-19

ABÙ ỌMA 80:1-19 Bible Nso (IGBOB)

Gi Onye nāzu Israel dika aturu, ṅa nti, Gi Onye nēdu Josef dika ìgwè ewu na aturu; Gi Onye bi n'etiti cherubim, nwuputa ka ìhè. N'iru Efraim na Benjamin na Manase, kpọte idi-ike-Gi, Je izọputa ayi. Chineke, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi. Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, Rùe ole mb͕e ka iwe-gi gākwu anwuru imegide ekpere ndi-Gi? I mewo ka ha rie nri nke bu anya-miri, I mewo kwa ka ha ṅua anya-miri nke juru ihe-ọtùtù uku. I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ilu-ọ̀gù: Ndi-iro-ayi nāchì kwa ọchì n'etiti onwe-ha. Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi. I si n'Ijipt ropu osisi vine: I nāchupu mba di iche iche, we kua ya. I doziri ọnọdu n'iru ya, O we b͕amie nkpọrọgwu, we juputa ala ahu. Ejiri ǹdò-ya kpuchie ugwu nile, Ngalaba-ya di kwa ka osisi cedar nke Chineke. Ọ nāwasa alaka-ya rue oké osimiri, Wasa kwa ome-ya rue Osimiri. N'ìhi gini ka I tiwaworo ogige-ya nile, Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ we ghọrọ nkpuru-ya? Ezì nke si n'oké ọhia puta nātakwosi ya, Anu nke nēnughari n'ọhia nēwere kwa ya izù onwe-ya. Chineke nke usu nile nke ndi-agha, biko, laghachikute ayi: Si n'elu-igwe legide anya, hu, leta kwa osisi vine a, Na ogwe-osisi nke aka-nri-Gi kuworo, Lekwasi kwa ngalaba nke I mere ka o nwere Gi ume. Esurewo ya n'oku, eb͕utuwo ya: Site n'ibasi-nba-ike nke iru-Gi ha nāla n'iyì. Ka aka-Gi di n'aru nwoke nke aka-nri-Gi, N'aru nwa nke madu onye I mere ka o nwere Gi ume. Ayi agaghi-esi kwa n'ebe I nọ laghachi azu: Me ka ayi di ndu, ọ bu kwa aha-Gi ka ayi gākpọku. Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata; Me ka iru-gi mua, ewe zọputa ayi.

ABÙ ỌMA 80:1-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel, gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ. Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim, nwupụta Ìhè nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase. Kpọtee ịdị ike gị, bịa zọpụta anyị. O Chineke, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị. O ONYENWE ANYị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ megide ekpere ndị gị? I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri; i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ. I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị, ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị. O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị. I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị; ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya. Ị sụchaara ya ala, mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile. Ndo ya kpuchiri ugwu niile, alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida. Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri wasaakwa ume ya ruo osimiri. Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya? Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya, ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri. Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ! Letakwa osisi vaịnị a, mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị. E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya; mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi. Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị. Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ; tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị. Kpọghachi anyị azụ, O ONYENWE ANYị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike zọpụta anyị.