ABÙ ỌMA 79:1-13
ABÙ ỌMA 79:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị; ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị, ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha, werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa. Ha awụpụla ọbara dịka mmiri nʼakụkụ niile nke Jerusalem, ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ. Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ, ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo. O ONYENWE ANYị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi? Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ? Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị dịka Chineke oke iwe gị, bụ alaeze niile ndị ahụ na-adịghị akpọku aha gị; nʼihi na ha eripịala Jekọb mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu. Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa. Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, nʼihi ebube nke aha gị; napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile nʼihi aha gị. Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?” Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ, na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru. Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ; site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ. Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi; anyị ga na-ekwupụta otuto gị, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
ABÙ ỌMA 79:1-13 Bible Nso (IGBOB)
Chineke, mba di iche iche abatawo n'ihe-nketa-Gi; Ha emeruwo ulo uku Gi di nsọ; Ha emewo Jerusalem ka ọ ghọ ihe etikpọro etikpọ. Ha ewerewo ozu ndi-orù-Gi nye iburu anu-ufe nke elu-igwe ihe-oriri, Were kwa anu-aru nke ndi-ebere-Gi nye anu-ọhia nile nke uwa. Ha awusiwo ọbara-ha dika miri buruburu Jerusalem; Ọ dighi kwa onye ọ bula ṅēli ozu-ha. Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta, Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò. Rùe ole mb͕e, Jehova, ka I ganēwe iwe rue mb͕e ebighi-ebi? Ekworo-Gi, ọ̀ ganēre dika ọku? Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi. N'ihi na ha eripiawo Jekob, Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu. Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi: Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi: N'ihi na ayi enweghi ike ma-ọli. Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n'ihi nsọpuru aha-Gi: Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n'ihi aha-Gi. N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ? Ka amara ya n'etiti mba nile n'anya-ayi, Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo. Kwe ka isu-ude nke onye-nkpọro bata n'iru Gi; Dika idi-uku nke ogwe-aka-Gi si di me ka ndi nāghaghi inwu anwu fọdu; Gi nyeghachi kwa ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta-ha nime obi-ha okpukpu asa, Bú nke ha jiri ta Gi uta, Onye-nwe-ayi. Ayi onwe-ayi, bú ndi-Gi na ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-gi, Gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi; Ọb͕ọ nile ka ayi gākọrọ akukọ otuto-Gi.