Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 79:1-13

Abụ Ọma 79:1-13 BIU

O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị; ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị, ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha, werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa. Ha awụpụla ọbara dịka mmiri nʼakụkụ niile nke Jerusalem, ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ. Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ, ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo. O ONYENWE ANYị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi? Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ? Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị dịka Chineke oke iwe gị, bụ alaeze niile ndị ahụ na-adịghị akpọku aha gị; nʼihi na ha eripịala Jekọb mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu. Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa. Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, nʼihi ebube nke aha gị; napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile nʼihi aha gị. Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?” Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ, na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru. Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ; site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ. Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi; anyị ga na-ekwupụta otuto gị, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.