Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 78:56-72

ABÙ ỌMA 78:56-72 Bible Nso (IGBOB)

Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n'okpuru Ya, Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile; Kama ha laghachiri azu, we ghọb͕ue nghọb͕u dika ndi bu nna-ha: Ha riri mpe dika uta nāghọ aghughọ. Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe, Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo. Chineke nuru nka, O we webiga iwe ókè, Jusie Israel ike: O we rapu ebe-obibi nke Shailo, Bú ulo-ikwū nke O mere ka o biri n'etiti madu; O we were ike-Ya nye ka adọta ya n'agha, Were kwa ima-nma-Ya nye n'aka onye-nkpab͕u. O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha; Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide. Ọku ripiara umu-okorọbia-ha; Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di. Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha; Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá. Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura, Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine. O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n'azu: Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha. Ọzọ, Ọ juru ulo-ikwū nke Josef, Ọ bughi kwa ebo Efraim ka Ọ rọputara; Kama Ọ rọputara ebo Juda, Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n'anya. O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu, Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi. Ọ rọputa-kwa-ara Devid, bú orù-Ya, O we si n'ogige ìgwè ewu na aturu kuru ya: O mere ka o si n'iso nne-aturu nke nēnye umu-ha ara bia, Izù Jekob, bú ndi-Ya, na Israel, bú ihe-nketa-Ya, dika aturu. O we nāzù ha dika izu-okè nke obi-ya si di; Were kwa ihe-nghọta nile nke ọbu-aka-ya abua nēdu ha.

ABÙ ỌMA 78:56-72 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa, nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu; ha edebeghị ụkpụrụ ya. Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ, ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma. Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya; sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya. Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam. Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ. O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka. O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya. Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha, ọ dịkwaghị onye a gụụrụ egwu ọlụlụ di na nwunye, nʼetiti ụmụ agbọghọ ha; E gburu ndị nchụaja ha nʼagha; ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ enwekwaghị ike iru ụjụ. Mgbe ahụ, onyenwe anyị tetara dịka onye si nʼụra teta, dịka dike si nʼụra mmanya teta. Ọ chụghachiri ndị iro ya azụ, mee ha ihe ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi. Ọ jụrụ ụlọ ikwu Josef, ọ họpụtaghị ebo Ifrem; ma ọ họọrọ ebo Juda, na ugwu Zayọn, nke ọ hụrụ nʼanya. O wuru ụlọnsọ ya ka ọ dị ka ebe dị elu, dịka ụwa nke o mere ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Ọ họpụtara Devid, ohu ya, kpọrọ ya site nʼọgba igwe atụrụ; o si nʼebe ọ nọ na-azụ atụrụ kpọrọ ya, ka ọ bịa bụrụ onye na-azụ ndị ya Jekọb, na Izrel, ihe nketa ya dịka atụrụ. Devid ji izuoke nke obi ya zụọ ha, aka nke maara ihe ọ na-eme ka o ji duo ha.