ABÙ ỌMA 63:2-5
ABÙ ỌMA 63:2-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị. Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma. Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị. Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 63ABÙ ỌMA 63:2-5 Bible Nso (IGBOB)
Otú a ka m'lekwasiworo Gi anya n'ebe nsọ gi, Ihu ike-Gi na nsọpuru-Gi. N'ihi na ebere-Gi di nma kari ndu; Eb͕ub͕ere-ọnum abua gāja Gi. Otú a ka m'gāgọzi Gi mb͕e m na-ādi ndu: N'aha-Gi ka m'gāchili akam elu. Afọ nēju nkpuru-obim dika agāsi na o rijuru umi-anu na abuba afọ; Ọ bu kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēti nkpu ọṅù ka ọnum nēji to Gi
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 63