ABÙ ỌMA 63:1-5
ABÙ ỌMA 63:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya. Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị. Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma. Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị. Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.
ABÙ ỌMA 63:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike: Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike, N'ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi. Otú a ka m'lekwasiworo Gi anya n'ebe nsọ gi, Ihu ike-Gi na nsọpuru-Gi. N'ihi na ebere-Gi di nma kari ndu; Eb͕ub͕ere-ọnum abua gāja Gi. Otú a ka m'gāgọzi Gi mb͕e m na-ādi ndu: N'aha-Gi ka m'gāchili akam elu. Afọ nēju nkpuru-obim dika agāsi na o rijuru umi-anu na abuba afọ; Ọ bu kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēti nkpu ọṅù ka ọnum nēji to Gi