ABÙ ỌMA 61:1-4
ABÙ ỌMA 61:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Chineke, nuru olu iti-nkpum; Ṅa nti ekperem. M'nēsi na nsọtu uwa kpọkue Gi, mb͕e, obim nādighi ike: Rue n'oké nkume nke kam elu ka I gēdurum je. N'ihi na I buworom ebe-nb͕abà, Ulo-elu di ike ipu n'iru onye-iro. Ka m'nọ dika ọbìa n'ulo-ikwū-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi: M'gāb͕abà n'ebe-nzuzo nke nkù-Gi abua. Selah
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 61ABÙ ỌMA 61:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nụrụ akwa m, O Chineke, gee ntị nʼekpere m. Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa, ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba; duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu. Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m, na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ. Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi, ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. Sela
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 61