ABÙ ỌMA 55:12-15
ABÙ ỌMA 55:12-15 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta; M'gānagide kwa ya: Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem; M'gēzonari kwa ya onwem: Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra, Eyìm, na onye m'mara nke-ọma. Ayi nāb͕akọri ìzù utọ, N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu. Ka ọnwu biakwasi ha na mberede, Ka ha ridarue ala-mọ na ndu: N'ihi na ihe ọjọ nile di n'ebe ha nọ dika ọbìa, n'etiti ha.
ABÙ ỌMA 55:12-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị, apụrụ m ịnagide ya; a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m, apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ. Maọbụ gị, nwoke dịka m, onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma, onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ, nʼụlọ Chineke, ka anyị na-ejegharị nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe. Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede; ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ, nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha.