ABÙ ỌMA 5:3-8
ABÙ ỌMA 5:3-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụtụtụ ụbọchị niile, O ONYENWE ANYị, ị ga-anụ olu m; aga m ekwupụtara gị ihe niile na-akpa m mkpa. Aga m elekwa anya ọsịsa gị. Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ; gị na ndị ajọ omume apụghị ibikọta. Ndị mpako agaghị eguzo nʼihu gị. Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị. Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi; ONYENWE ANYị kpọrọ ndị ogbu mmadụ niile na ndị aghụghọ niile asị. Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị, site nʼoke ịhụnanya gị; aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị. ONYENWE ANYị, biko, duo m nʼime ezi omume gị nʼihi ndị iro m; mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m.
ABÙ ỌMA 5:3-8 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, n'ututu ka I gānu olum; N'ututu ka m'gēdoro Gi ekperem n'usoro, che kwa nche. N'ihi na ọ bughi Chineke nke nmebi-iwu nātọ utọ ka I bu: Ihe ọjọ agaghi-anọ dika ọbia n'ebe I nọ. Ndi nānya isi agaghi-eguzo onwe-ha n'anya-Gi: I kpọrọ ndi nile nālu ajọ ihe asì. I gēme ka ndi nile nēkwu okwu-ugha la n'iyì: Madu nke bu onye-ọbara na onye- aghughọ, Jehova nākpọ ya onye-árú. Ma mu onwem, n'uba nke ebere-Gi ka m'gābà n'ulo-Gi: M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di n'egwu-Gi. Jehova, dubem n'ezi omume-Gi n'ihi ndi nēchem anwu; Me ka uzọ-Gi zie ezi n'irum.