Ụtụtụ ụbọchị niile, O ONYENWE ANYị, ị ga-anụ olu m; aga m ekwupụtara gị ihe niile na-akpa m mkpa. Aga m elekwa anya ọsịsa gị. Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ; gị na ndị ajọ omume apụghị ibikọta. Ndị mpako agaghị eguzo nʼihu gị. Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị. Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi; ONYENWE ANYị kpọrọ ndị ogbu mmadụ niile na ndị aghụghọ niile asị. Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị, site nʼoke ịhụnanya gị; aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị. ONYENWE ANYị, biko, duo m nʼime ezi omume gị nʼihi ndị iro m; mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m.
Gụọ Abụ Ọma 5
Geere nke a ntị Abụ Ọma 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 5:3-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo