ABÙ ỌMA 48:9-14
ABÙ ỌMA 48:9-14 Bible Nso (IGBOB)
Ayi echèwo ebere-Gi echè, Chineke, N'etiti ulo uku Gi. Dika aha-Gi si di, Chineke, Otú a ka otuto-Gi di rue nsọtu nile nke uwa: Ezi omume juputara aka-nri-Gi. Ka ugwu Zaion ṅuria ọṅu, Ka umu-ndinyom Juda tegharia egwú ọṅù, N'ihi ikpé-Gi nile. Jenu Zaion buruburu, b͕a kwa ya buruburu: Guanu ulo-elu-ya nile ọnu. Tukwasinu obi-unu n'ékpè-ya, Tulenu ulo nile ya di elu; Ka unu we kọrọ ọb͕ọ nēso n'azu. N'ihi na Nka bu Chineke, bú Chineke-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi; Ya onwe-ya ganēdu ayi rue n'inwu-ọnwu.
ABÙ ỌMA 48:9-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị, ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ. O Chineke, dịka aha gị, otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile; aka nri gị jupụtara nʼezi omume. Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ, obodo nta niile nke Juda nwere obi ụtọ nʼihi ikpe gị niile. Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu, gụọkwanụ ụlọ elu ya niile ọnụ. Lezienụ mgbidi ya niile anya, nyochakwaanụ ebe ya niile e wusiri ike, ka unu nwee ike ịkọrọ ọgbọ na-abịa nʼihu akụkọ ndị a. Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi, ọ ga-abụ onyendu anyị, ọ bụladị ruo nʼọgwụgwụ.