O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị, ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ. O Chineke, dịka aha gị, otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile; aka nri gị jupụtara nʼezi omume. Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ, obodo nta niile nke Juda nwere obi ụtọ nʼihi ikpe gị niile. Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu, gụọkwanụ ụlọ elu ya niile ọnụ. Lezienụ mgbidi ya niile anya, nyochakwaanụ ebe ya niile e wusiri ike, ka unu nwee ike ịkọrọ ọgbọ na-abịa nʼihu akụkọ ndị a. Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi, ọ ga-abụ onyendu anyị, ọ bụladị ruo nʼọgwụgwụ.
Gụọ Abụ Ọma 48
Geere nke a ntị Abụ Ọma 48
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 48:9-14
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo