ABÙ ỌMA 42:9-11
ABÙ ỌMA 42:9-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ana m asị Chineke, oke nkume m, “Gịnị mere i ji chefuo m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ nʼihi mmegbu nke onye iro?” Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu, mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị, ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m, “Olee ebe Chineke gị nọ?” O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, Onye nzọpụta m na Chineke m.
ABÙ ỌMA 42:9-11 Bible Nso (IGBOB)
Ka m'si Chineke, bú nkumem di elu, N'ìhi gini ka I chezọworom? N'ìhi gini ka m'nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro? Dika asi na eji ihe gwepia ọkpukpum nile, ndi nākpab͕um nātam uta; Mb͕e ha nāsin ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ? Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'agēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.