Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 42:1-11

ABÙ ỌMA 42:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke. Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke? Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri nʼehihie ma nʼabalị, mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile, “Olee ebe Chineke gị nọ?” Ihe ndị a ka m na-echeta mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m: ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga, mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi, na-aga nʼụlọ Chineke. O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya, Onye nzọpụta m na Chineke m. Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m; ya mere, aga m echeta gị site nʼala Jọdan, na ebe dị elu nke Hemon, na sitekwa nʼugwu Miza. Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile; ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile ekpuchiela isi m. Nʼehihie, ONYENWE ANYị na-awụkwasị m ịhụnanya ya, nʼabalị abụ ya dị m nʼobi, ekpere nye Chineke nke ndụ m. Ana m asị Chineke, oke nkume m, “Gịnị mere i ji chefuo m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ nʼihi mmegbu nke onye iro?” Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu, mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị, ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m, “Olee ebe Chineke gị nọ?” O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, Onye nzọpụta m na Chineke m.

ABÙ ỌMA 42:1-11 Bible Nso (IGBOB)

Dika agu iyi miri si agu nne-ele, Otú a ka agu Gi nāgu nkpuru-obim, Chineke. Akpiri Chineke, bú Chineke di ndu, akpọwo nkpuru-obim nku: Òle mb͕e m'gābia, ewe hum n'iru Chineke? Anya-mirim aghọworom nri ehihie na abali, Mb͕e ha nāsim ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ? Ihe ndia ka m'gēcheta, wusi kwa nkpu tu-obim nimem dika miri, Otú m'nāgabiga n'etiti ìgwè madu, nējere ha nwayọ dika onye-ndú-ha rue ulo Chineke, N'olu iti-nkpu-ọṅù na nke ekele, bú ìgwè madu nēme ememe. Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọ N'ihi nzọputa nile nke iru-Ya. Chinekem, nimem ka nkpuru-obim nēruda n'ala: N'ihi ya anamecheta Gi site n'ala Jọdan, Site kwa na Heamon, site n'ugwu Miza. Ob͕u-miri nākpọ ob͕u-miri òkù n'olu nrùda-miri nile nke Gi: Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile agabigawo n'isim. N'ehihie Jehova gēnye ebere-Ya iwu, N'abali kwa ka abù-Ya gādi n'onum, Bú ekpere m'nēkpere Chineke nke ndum. Ka m'si Chineke, bú nkumem di elu, N'ìhi gini ka I chezọworom? N'ìhi gini ka m'nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro? Dika asi na eji ihe gwepia ọkpukpum nile, ndi nākpab͕um nātam uta; Mb͕e ha nāsin ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ? Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'agēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.