ABÙ ỌMA 41:5-9
ABÙ ỌMA 41:5-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị iro m na-esite nʼiro ha ekwu okwu megide m na-asị, “Olee mgbe ọ ga-anwụ ka aha ya laa nʼiyi?” Mgbe otu nʼime ha bịara ịhụ m, ọ na-ekwu okwu ụgha, ma obi ya na-achịkọta ihe nkwulu; mgbe ahụ ọ na-apụ, ga kọsaa ya. Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m; ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha: “Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya; ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.” Ọ bụladị ezigbo enyi m, onye m tụkwasịrị obi, onye mụ na ya na-eso erikọ nri m, ebiliela imegide m.
ABÙ ỌMA 41:5-9 Bible Nso (IGBOB)
Ndi-irom nēkwu ihe ọjọ bayerem, si. Òle mb͕e ọ gānwu, aha-ya ewe la n'iyì? Ọ buru kwa na ọ bia ihum, ihe-efu ka ọ nēkwu; Obi-ya nāchikọtara onwe-ya ajọ ihe: Ọ nāpu n'èzí nēkwu ya. Ndi nile nke nākpọm asì nātakwurita ntakwu imegidem: N'imegidem ka ha nēchèrem ihe ọjọ. Anāwukwasi ya ihe jọb͕uru onwe-ya, ka ha kwuru: E, nke o dinaworo ub͕u a ọ gaghi-ebili ọzọ. Ọbuná nwoke nke mu na ya di n'udo, onye m'tukwasiri obi, onye nēri nrim, Ọ mewo ikiri-ukwu-ya ka ọ di uku imegidem.