ABÙ ỌMA 37:3-7
ABÙ ỌMA 37:3-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Tụkwasị ONYENWE ANYị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ. Ka ihe ONYENWE ANYị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị. Nyefee onwe gị nʼaka ONYENWE ANYị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a: Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie. Dere duu nʼihu ONYENWE ANYị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.
ABÙ ỌMA 37:3-7 Bible Nso (IGBOB)
Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe; Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi. Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ; Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ. Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru; Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya. Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè, Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie. Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya: Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya, N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche.