ABÙ ỌMA 37:10-20
ABÙ ỌMA 37:10-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga; ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha. Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, ha ga-enwekwa udo dị ukwuu. Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume, na-ata ikekere eze megide ha; ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị, nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa. Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha, kwee ụta ha ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa, igbu ndị ụzọ ha ziri ezi. Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, kụrisiekwa ụta ha. Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume; nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, ma ONYENWE ANYị ga-akwagide ndị ezi omume. Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta ONYENWE ANYị, ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ; ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ. Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi. Nʼagbanyeghị na ndị iro ONYENWE ANYị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ, ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ.
ABÙ ỌMA 37:10-20 Bible Nso (IGBOB)
Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa: I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ. Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala; Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ. Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume, Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé. Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì: N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya; Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da, Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha: Mma-agha-ha gābà n'obi onwe-ha, Agāb͕aji kwa uta-ha. Ihe ntà onye ezi omume nwere di nma Kari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu. N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu: Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume. Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè: Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi. Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ: Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu. N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì, Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu: Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè.