ABÙ ỌMA 37:1-9
ABÙ ỌMA 37:1-9 Bible Nso (IGBOB)
Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ, Ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo. N'ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa, Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu. Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe; Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi. Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ; Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ. Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru; Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya. Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè, Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie. Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya: Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya, N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche. Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma: Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ. N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ: Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.
ABÙ ỌMA 37:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ, maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo; nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa, dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa. Tụkwasị ONYENWE ANYị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ. Ka ihe ONYENWE ANYị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị. Nyefee onwe gị nʼaka ONYENWE ANYị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a: Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie. Dere duu nʼihu ONYENWE ANYị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile. Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ. Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na ONYENWE ANYị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.