Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 37:1-40

ABÙ ỌMA 37:1-40 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ, maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo; nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa, dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa. Tụkwasị ONYENWE ANYị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ. Ka ihe ONYENWE ANYị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị. Nyefee onwe gị nʼaka ONYENWE ANYị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a: Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie. Dere duu nʼihu ONYENWE ANYị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile. Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ. Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na ONYENWE ANYị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha. Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga; ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha. Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, ha ga-enwekwa udo dị ukwuu. Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume, na-ata ikekere eze megide ha; ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị, nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa. Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha, kwee ụta ha ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa, igbu ndị ụzọ ha ziri ezi. Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, kụrisiekwa ụta ha. Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume; nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, ma ONYENWE ANYị ga-akwagide ndị ezi omume. Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta ONYENWE ANYị, ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ; ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ. Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi. Nʼagbanyeghị na ndị iro ONYENWE ANYị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ, ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ. Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya, ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere. Ndị ONYENWE ANYị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa, ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ. Ọ bụrụ na ONYENWE ANYị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike; ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na ONYENWE ANYị na-eji aka ya ejigide ya. Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri. Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe, ụmụ ha ga-abụ ngọzị. Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi. ONYENWE ANYị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya. Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi, ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ; ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi. Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi. Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ. Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo, na-achọ ịnapụ ha ndụ ha; ma ONYENWE ANYị agaghị ahapụ ha nʼaka ha, ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe. Chere ONYENWE ANYị, debekwa ụzọ ya. Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa; mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya. Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike, ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala, ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ, nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya. Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama; ọganihu dịịrị onye udo. Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi; ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume. Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka ONYENWE ANYị bịa; ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu. ONYENWE ANYị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume, nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.

ABÙ ỌMA 37:1-40 Bible Nso (IGBOB)

Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ, Ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo. N'ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa, Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu. Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe; Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi. Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ; Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ. Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru; Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya. Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè, Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie. Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya: Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya, N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche. Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma: Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ. N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ: Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala. Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa: I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ. Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala; Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ. Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume, Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé. Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì: N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya; Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da, Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha: Mma-agha-ha gābà n'obi onwe-ha, Agāb͕aji kwa uta-ha. Ihe ntà onye ezi omume nwere di nma Kari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu. N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu: Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume. Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè: Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi. Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ: Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu. N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì, Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu: Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè. Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi: Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye. N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala; Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha. Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike; Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ. Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya: N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya. Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye; Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya, Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri. Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe; Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe; Biri kwa rue mb͕e ebighi-ebi. N'ihi na Jehova nāhu ezi ikpé n'anya, Ọ dighi-arapu kwa ndi-ebere-Ya; Rue mb͕e ebighi-ebi ka anēdebe ha: Ma agēbipu nkpuru ndi nēmebi iwu. Ndi ezi omume gēnweta ala, Biri kwa n'elu ya rue mb͕e ebighi-ebi. Ọnu onye ezi omume nēkwu okwu amam-ihe, dika onye nātughari uche, Ire-ya nēkwu kwa okwu ezi ikpé. Iwu Chineke-ya di n'obi-ya; Nzọ-ukwu-ya nile agaghi-ab͕uchapu kwa. Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche, Nāchọ kwa ime ka ọ nwua. Jehova agaghi-arapu ya n'aka-ya, Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe. Nēle anya Jehova, nēdebe kwa uzọ-Ya, Ọ gēbuli kwa gi inweta ala: Mb͕e anēbipu ndi nēmebi iwu, i gāhu. Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji, Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya. O we gabiga, ma, le, ọ nọgh: M'we chọ ya, ma achọtaghi ya. Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi: N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo. Ma ndi-njehie, anēkpochapu ha n'otù: Agēbipu ọdi-n'iru nke ndi nēmebi iwu. Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n'aka Jehova bia: Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà. Jehova nēye-kwa-ra ha aka, nēme ka ha b͕apu: Ọ nēme ka ha si n'aka ndi nēmebi iwu b͕apu, Ọ nāzọputa kwa ha, N'ihi na ha ab͕abàwo nime Ya.