ABÙ ỌMA 37:1-22
ABÙ ỌMA 37:1-22 Bible Nso (IGBOB)
Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ, Ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo. N'ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa, Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu. Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe; Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi. Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ; Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ. Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru; Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya. Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè, Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie. Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya: Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya, N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche. Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma: Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ. N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ: Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala. Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa: I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ. Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala; Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ. Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume, Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé. Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì: N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya; Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da, Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha: Mma-agha-ha gābà n'obi onwe-ha, Agāb͕aji kwa uta-ha. Ihe ntà onye ezi omume nwere di nma Kari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu. N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu: Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume. Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè: Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi. Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ: Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu. N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì, Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu: Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè. Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi: Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye. N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala; Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.
ABÙ ỌMA 37:1-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ, maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo; nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa, dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa. Tụkwasị ONYENWE ANYị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ. Ka ihe ONYENWE ANYị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị. Nyefee onwe gị nʼaka ONYENWE ANYị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a: Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie. Dere duu nʼihu ONYENWE ANYị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile. Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ. Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na ONYENWE ANYị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha. Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga; ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha. Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, ha ga-enwekwa udo dị ukwuu. Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume, na-ata ikekere eze megide ha; ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị, nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa. Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha, kwee ụta ha ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa, igbu ndị ụzọ ha ziri ezi. Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, kụrisiekwa ụta ha. Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume; nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, ma ONYENWE ANYị ga-akwagide ndị ezi omume. Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta ONYENWE ANYị, ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ; ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ. Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi. Nʼagbanyeghị na ndị iro ONYENWE ANYị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ, ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ. Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya, ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere. Ndị ONYENWE ANYị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa, ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ.