ABÙ ỌMA 35:1-28
ABÙ ỌMA 35:1-28 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù: Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha. Jide ọta na ọta uku, Bilie iyerem aka. Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum: Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M'bu. Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike: Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem. Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha. Ka uzọ-ha b͕a ọchichiri, ka ọ buru kwa ebe nālo nālọ, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nāchu ha. N'ihi na ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha, Ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim. Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi; Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya: Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya. Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova: Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya. Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi? Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya, I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike. Ndi-àmà nke ihe-ike nēbili; Ihe nke m'nāmaghi ka ha nājum. Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa. Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe: Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu; Ekperem nālaghachikute kwa obim. Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri: Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe. Ma mb͕e m'nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha: Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m'nāmaghi; Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du: Dika ndi emeruru emeru n'etiti ndi nāchì ọchì n'ihi ob͕e-achicha, Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé. Onye-nwe-ayi, #mb͕e ole ka I ganēle anya? Si na ntikpọ nile ha weghachi nkpuru-obim, Si n'aka umu-ọdum weghachi nkpuru-obi m'nwere nání ya. M'gēkele Gi n'etiti nkpọkọta bara uba: N'etiti otù ndi nwere ume ka m'gēto Gi. Ekwela ka ndi-irom, bú ndi-okwu-ugha, ṅuam ọǹu: Ekwela ka ndi nākpọm asì mb͕e m'nēmeghi ihe b͕ue iku-anya. N'ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu: Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n'ala. Ha we me ka ọnu-ha sa mbara imegidem; Ha siri, Ehe, ehe, anya-ayi ahuwo ya. I huwo ya, Jehova; ab͕ala nkiti: Onye-nwe-ayi, anọlam n'ebe di anya. Kpọte Onwe-gi, kpetara ikpe m, Chinekem na Onye-nwem, tetara okwu-ikpem. Kpem ikpe dika ezi omume-Gi si di, Jehova, bú Chinekem; Ekwe-kwa-la ka ha ǹuam ọǹu. Ekwela ka ha si n'obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi: Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya. Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n'ihe ọjọ nādakwasim: Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem. Ka ha tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa ọṅu, bú ndi ezi omumem nātọ utọ: Ka ha nāsi kwa mb͕e nile, Jehova di uku, Onye udo orù-Ya nātọ Ya utọ. Irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi, Baye-kwa-ra otuto-Gi ogologo ubọchi nile.
ABÙ ỌMA 35:1-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ; buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha. Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị; bilie bịa nyere m aka. Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị; bịa zute ndị na-achụ m ọsọ. Gwa mkpụrụobi m, “Abụ m nzọpụta gị.” Mee ka ihere mee ndị niile na-agbalịsị ike igbu m. Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ, na ndị ihere mere. Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe, ka mmụọ ozi ONYENWE ANYị bụrụ onye na-achụfu ha. Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị; ka mmụọ ozi ONYENWE ANYị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha, ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m. Ka mbibi bịakwasị ha na mberede, ka ụgbụ ha zobeere m kee ha; ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru. Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na ONYENWE ANYị, ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya. Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị, “O ONYENWE ANYị, ọ bụ onye dịka gị? Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha, ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.” Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m; ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ. Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ. Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ. Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe, site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala. Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa, ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m, jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ. Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ; mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m. Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka. Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe, na-atakwara m ikikere eze ha. O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme? Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile, site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa. Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu, nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị. Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m, mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị; ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro, mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike. Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu, kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ. Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị, “Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.” O ONYENWE ANYị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị; anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị. Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m. Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m. O ONYENWE ANYị Chineke m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị; ekwekwala ka ha chịa m ọchị. Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!” Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!” Mee ka ihere na ọgbaaghara bụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m; were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe, bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m. Ka ndị niile mkpepụta m dị mma were obi ụtọ tie mkpu ọṅụ; ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie ONYENWE ANYị elu, onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.” Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gị na otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.