ABÙ ỌMA 33:6-9
ABÙ ỌMA 33:6-9 Bible Nso (IGBOB)
Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe; Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile. Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe: Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche. Ka uwa nile tua egwu Jehova: Ka ndi nile ndi bi n'elu-uwa dum madu bi tua ujọ Ya. N'ihi na Ya onwe-ya kwuru okwu, o we di; Ya onwe-ya nyere iwu, o we guzo.
ABÙ ỌMA 33:6-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ site nʼokwu ọnụ ONYENWE ANYị ka e ji kee eluigwe niile, jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile. Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe, kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu. Ka ụwa niile tụọ ONYENWE ANYị egwu; ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya. Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara; o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm.